Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 22:4 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke unu enyela ụmụnna unu mmeri. O meekwala ka ha zuru ike dịka o kwere nkwa na ọ ga-eme. Ugbu a, laghachinụ nʼụlọ unu, laghachikwanụ nʼala unu, ala ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

4 Ma ub͕u a Jehova, bú Chineke-unu, emewo ka umu-nne-unu zuru ike, dika Ọ gwara ha okwu: ub͕u a kwa chigharianu, jerue ulo-ikwū-unu n'onwe-unu, rue ala ihe-onwunwe-unu, nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'ofè Jọdan.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 22:4
16 Iomraidhean Croise  

Ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ na Onyenwe anyị Chineke anọnyereghị unu? Ọ bụ na o nyebeghị unu udo nʼakụkụ niile? Nʼihi na o nyela m mmeri nʼebe ndị iro m nọ. Ugbu a, ala a dịkwa nʼaka Onyenwe anyị na nʼaka ndị ya.


Ọ zara sị, “Mụ onwe m ga-eso gị gaa, aga m enyekwa gị izuike.”


Anyị agaghị alọta nʼụlọ anyị tutu onye Izrel ọbụla enweta ihe nketa nke ya.


nʼihi na iwu ndị a ebidobeghị ịdị ire, ebe ọ bụ na unu abanyebeghị nʼebe izuike ahụ, na ihe nketa ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu.


Anyị weere ala ha nye agbụrụ Ruben, na Gad, na otu ọkara ebo Manase, dịka ihe nketa ha.


tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-enye ụmụnna unu mmeri dịka o nyere unu. Mgbe ha nwetara ala Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye ha nʼofe Jọdan, onye ọbụla nʼime unu nwere ike lọghachi bịa biri nʼala unu.”


Nʼihi na a sị na Joshua nyere ha ezumike, ọ gaghị ekwu banyere ụbọchị ọzọ.


tutu ruo mgbe Onyenwe anyị Chineke unu nyere ha izuike, dịka o si nye unu, na tutu ruo mgbe ha nwetara ala niile bụ nke Onyenwe anyị Chineke unu ga-enye ha. Mgbe nke a mezuru, unu ga-alaghachi azụ, nweta ala ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan.”


Ọ bụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị, na ụmụ Izrel, lara eze abụọ ndị a nʼiyi. Mosis nyekwara ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase ala ha.


Nke a bụ ala Mosis nyere ebo Ruben dịka agbụrụ ha si dị, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.


Ọkara ebo Manase, na ebo Ruben, na Gad, enwetala ihe nketa ha nʼofe ọzọ nke Jọdan, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ha.


E, unu arụzuola ọrụ ahụ Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. Unu ahapụghị ụmụnna unu nʼọgbọ agha ogologo ụbọchị ndị a niile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan