Ndị na-enyere ya aka bụ Eden, Miniamin, Jeshua, Shemaya, Amaraya na Shekanaya. Ha na-eke onyinye ahụ nye ndị nchụaja niile nʼobodo ahụ, onye ukwu na onye nta, dịka usoro ịrụ ọrụ ha si dị. Ha ji ikwesi ntụkwasị obi na-enyere ya aka.
Ndị buru ụzọ nweta oke site nʼife nza bụ ikwu Kohat dịka ikwu ha si dị. E sitere nʼala ndị Juda, na Simiọn, na Benjamin nye ha obodo iri na atọ, ka ọ bụrụ ihe nketa ụmụ Kohat ndị si nʼebo Livayị, ndị bụkwa ụmụ ụmụ Erọn onye nchụaja.