Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 21:8 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ya mere, ụmụ Izrel mezuru iwu niile Onyenwe anyị nyere Mosis site nʼikenye ndị Livayị obodo ha ga-ebi, nakwa ebe anụ ụlọ ha ga-ata nri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

8 Umu Israel we nye ndi Livai obodo ndia na ebe-ita-nri-ha n'ife-nzà, dika Jehova nyere iwu n'aka Moses.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 21:8
11 Iomraidhean Croise  

“Simiọn na Livayị bụ ụmụnne. Mma agha ha bụ ngwa ihe ike.


Ihe a bụrụ ọnụ ka iwe ha bụ, nʼihi na ọ dị njọ. Ọnụma ha, ọ jọbigara njọ oke. Aga m ekesa ha nʼetiti ụmụ Jekọb Kpasaa ha nʼetiti ndị Izrel.


A na-efe nza, nʼihi ịchọpụta uche Onyenwe anyị, maọbụ Chineke nʼonwe ya na-ekpebi ihe a ga-efeta na nza ahụ.


Ife nza na-akwụsị esemokwu na ndọrọndọrọ dị nʼetiti mmadụ abụọ ndị olu ha na-ala elu.


Ya mere, ha bịakwutere Mosis na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu nzukọ Izrel, sị ha,


Unu ga-eke ala ahụ site nʼife nza, dịka agbụrụ unu niile si dị. Ndị bara ụba nye ha ihe nketa dị ukwuu, ndị dị ole na ole nye ha ihe nketa dị nta. Ihe ọ bụla ruuru agbụrụ ọbụla site nʼife nza ga-abụ nke ha. Kee ya dịka ebo nna nna unu ha si dị.


Obodo ndị a ga-abụrụ ha ebe obibi, ma ala niile gbara ha gburugburu ga-abụ ebe ịta nri nke igwe ehi na atụrụ, na anụ ụlọ ha niile.


Unu depụtachaa ụzọ asaa ndị a nʼakwụkwọ, werenụ ya bịakwute m ka m feere unu nza nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị ịchọpụta ebo ga-eketa akụkụ ọbụla nʼala ahụ.


Nʼihi nke a, dịka iwu Onyenwe anyị si dị, ụmụ Izrel sitere nʼihe nketa ha nye ndị Livayị obodo ụfọdụ, nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri.


Ụmụ Merari dịka ikwu ha si dị ketara obodo iri na abụọ site nʼala ndị ebo Ruben, na Gad, na Zebụlọn.


Ha sitere nʼebo Juda na Simiọn, kepụta obodo ndị a akpọrọ aha


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan