Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 20:9 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Obodo mgbaba ndị a a họpụtara bụ maka ndị ọbịa bi nʼetiti ụmụ Izrel, na maka ụmụ Izrel. Ọ bụ ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama ga-agbaga. Onye na-abọrọ ọbọ ọchụ agaghị egbukwa onye ahụ tupu e kpee ya ikpe nʼọgbakọ ndị Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

9 Ndia bu obodo akara àkà bayere umu Israel nile, baye-kwa-ra ọbìa nke nānọ dika ọbìa n'etiti ha, ka onye ọ bula nke nētib͕u madu n'ọghọm we b͕alaga n'ebe ahu, ghara kwa onwu n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, rue mb͕e ọ gēguzo n'iru nzukọ Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 20:9
5 Iomraidhean Croise  

Obodo isii ndị a unu wepụtara ga-abụ obodo mgbaba.


Obodo ndị a agaghị abụ ebe izere ndụ maka naanị ndị Izrel, kama ọ dịkwara ndị ọbịa na ndị ọzọ bi nʼetiti unu, ka onye na-akpachaghị anya gbuo mmadụ gbaga ebe ahụ izere ndụ ya.


Mgbe onye gburu mmadụ ahụ na-amaghị ama gbabara nʼime otu obodo ndị a, ọ ga-eguzo nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ gwa ndị okenye obodo ahụ ihe niile mere. Ndị okenye ahụ ga-akpọbata ya nʼime obodo ahụ, nye ya ebe ọ ga-ebi nʼetiti ha.


Onye ahụ gburu mmadụ na-amaghị ama ga-anọgide nʼobodo ahụ ruo mgbe ọ ga-akwụrụ nʼihu nzukọ maka ikpe ruokwa mgbe onyeisi nchụaja nọ nʼoge ahụ nwụrụ. Mgbe ahụ, o nwere ike laghachi nʼụlọ nke aka ya na nʼobodo ya bụ ebe o si gbapụ ọsọ.”


Ha kewapụtara obodo atọ ọzọ nʼihi otu ihe ahụ, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan nʼofe Jeriko. Obodo atọ ndị a bụ, Beza, nke dị nʼọzara, nʼala larịị ahụ e nyere ebo Ruben, na Ramọt; nke dị nʼime Gilead bụ ala ebo Gad; na Golan, nʼime Bashan, nke e si nʼala ebo Manase wepụta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan