Ndị a bụ oke ala nke Elieza onye nchụaja, Joshua nwa Nun na ndịisi ụlọ ebo ụmụ Izrel, kere na Shaịlo site nʼife nza nʼihu Onyenwe anyị, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ha si otu a kebie ala ahụ.
Nwoke ahụ zaghachiri ya sị, “Ọ dịghị onye m dịnyeere, kama abịara m ugbu a dịka ọchịagha usuu ndị agha Onyenwe anyị.” Joshua dara nʼala kpuo ihu ya nʼala kpọọ isiala nye ya, sị ya, “Ejikerela m ime ihe ọbụla i nyere nʼiwu. Onyenwe m, gịnị ka ị chọrọ ka m mee?”