Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 2:6 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 (Nʼeziokwu ọ bụ Rehab nʼonwe ya mere ka mmadụ abụọ ahụ rigoro nʼelu ụlọ ebe o zoro ha nʼokpuru ahịhịa flakisi ọ wụsara nʼebe ahụ.)

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

6 Ma ya onwe-ya mere ka ha rigo n'elu-ulo, o we zobe ha n'ókpòrò flax, nke edoro n'uso nye ya n'elu-ulo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 2:6
17 Iomraidhean Croise  

Nʼotu uhuruchi, Devid sitere nʼihe ndina ya bilie, gagharịa nʼelu ụlọeze ya. Ọ sitere nʼelu ụlọ ahụ hụ otu nwanyị na-asa ahụ. Nwanyị ahụ mara mma nke ukwu nʼile anya.


Nwunye nwoke ahụ weere ihe mkpuchi ya tụsaa nʼọnụ olulu mmiri ahụ gbasaakwa mkpụrụ ọka nʼelu ya. Ọ dịghị onye maara maka ya.


Ọ bụ na onyenwe m anụghị ihe m mere mgbe Jezebel nọ na-egbu ndị amụma Onyenwe anyị? E zoro narị ndị amụma Onyenwe anyị nʼime ọgba nkume abụọ, iri ise nʼime otu ọgba nkume, iri ise nʼime otu ọgba nkume ka m zoro ha, jirikwa nri na mmiri ọṅụṅụ zụọ ha.


Mgbe eze nwanyị bụ Jezebel na-egbu ndị amụma Onyenwe anyị chọọ igbuchapụ ha, ọ bụ Ọbadaya zoro narị ndị amụma nʼime ha nʼime ọgba nkume. O zoro iri ndị amụma ise nʼotu ọgba nkume, zookwa iri ndị amụma ise fọdụrụ nʼime ọgba nkume ọzọ. Emesịa, ọ na-ewegara ha nri na mmiri nʼebe ahụ.)


Ma Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, ma bụrụkwa nwanne nwanyị Ahazaya, kuuru Joash nwa Ahazaya, zopu ya site nʼetiti ụmụ ndị ikom eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina, ka Atalaya hapụ ịhụ ya, nke a mere na-egbughị ya.


Nwanyị a tụụrụ ime, mụọ otu nwa nwoke. Mgbe ọ hụrụ na nwa ọhụrụ ahụ mara mma, o zoro ya nʼụlọ ọnwa atọ.


Kama eze nyere Jerameel otu nʼime ụmụ eze, na Seraya nwa Azriel, na Shelemaya nwa Abdeel iwu ijide Baruk ode akwụkwọ, na Jeremaya onye amụma, ma Onyenwe anyị zoro ha.


Ka onye nọ nʼelu ụlọ ghara ịrịdata ka ọ banye nʼime ụlọ ya, ịkwapụta ngwongwo dị nʼime ụlọ ya.


Mgbe i wuru ụlọ, wuokwa ihe mgbochi gburugburu elu ya, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara isi nʼelu ya dapụ, si otu a wetara ụlọ na onye nwe ya ikpe ọmụma nke iwufu ọbara.


Nʼihi na unu anwụọla. E zokwara ndụ unu nʼime Chineke site na Kraịst.


Okwukwe ka nne na nna Mosis ji zobe ya ọnwa atọ mgbe a mụrụ ya, nʼihi na ha hụrụ na ọ bụ nwa mara mma. Ha atụkwaghị egwu iwu eze ala Ijipt bụ Fero nyere.


Nʼotu ụzọ ahụ, agụnyeghị Rehab, nwanyị akwụna ahụ nʼonye ezi omume nʼihi ọrụ ọ rụrụ, mgbe ọ kpọbatara ndị nnyopụta ahụ ma zipụkwa ha site nʼụzọ dị iche?


Ma ha apụọlarị. Ha hapụrụ obodo a mgbe a na-achọ imechi ọnụ ụzọ ama, nʼoge ọchịchịrị bidoro ịgba. Amaghị m ebe ha gara. Ma, nʼuche m, ọ bụrụ na unu achụso ha ọsọ ọsịịsọ unu nwere ike ijide ha.”


Ya mere, ndị ikom ahụ pụrụ na-achụ ndị nnyopụta ahụ nʼakụkụ ụzọ gara ngabiga Jọdan. Ma ngwangwa ha pụrụ, e mechiri ọnụ ụzọ ama e si abata obodo ahụ.


Ma tupu ndị nnyopụta ahụ edina ala ịrahụ ụra nʼabalị ahụ, Rehab rịgokwuru ha,


Joshua mere ka Rehab, nwanyị akwụna ahụ, na ndị ezinaụlọ ya niile dịrị ndụ. Nʼihi na Rehab zoro ndị ikom abụọ Joshua zigara, mee ka ha dị ndụ, bụ ndị gara inyochapụta obodo Jeriko. Ya mere, o binyere ndị Izrel ruo taa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan