Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 2:5 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ma ha apụọlarị. Ha hapụrụ obodo a mgbe a na-achọ imechi ọnụ ụzọ ama, nʼoge ọchịchịrị bidoro ịgba. Amaghị m ebe ha gara. Ma, nʼuche m, ọ bụrụ na unu achụso ha ọsọ ọsịịsọ unu nwere ike ijide ha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

5 o rue, mb͕e agaje imechi ọnu-uzọ-ama, n'ọchichiri, na ndikom ahu puru: amaghi ebe ndikom ahu jere: chuanu ha ngwa ngwa; n'ihi na unu gēru ha aru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 2:5
11 Iomraidhean Croise  

Nʼihi nke a, enyere m iwu na a ga-emechi ọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼuhuruchi tupu ụbọchị izuike, ruo mgbe ụbọchị izuike gafesịrị. Emere m ka ụfọdụ ndị ohu m na-anọ na nche nʼebe ahụ, ịhụ na ọ dịghị onye ahịa ọbụla ga-abata nʼime obodo Jerusalem nʼụbọchị izuike.


Ọnụ ụzọ ama gị ga-eghe oghe oge niile site nʼụtụtụ ruo nʼụtụtụ, ịnabata akụ niile si na mba dị iche iche. A ga-edurukwa ndị eze dị iche iche bata nʼime ya nʼọnọdụ ndị a dọtara nʼagha.


Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “a ga-achọ ajọọ omume nke Izrel, ma ọ dịghị nke a ga-achọta. A ga-achọkwa mmehie niile nke Juda, ma o nweghị nke a ga-achọta, nʼihi na aga m agbaghara ndị ahụ m mere ka ha fọdụ mmehie ha.


Mkpụrụ osisi dị iche iche ga-eto nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ. Akwụkwọ ha agaghị akpọnwụ akpọnwụ, mkpụrụ ga-adị nʼelu ha mgbe niile. Mkpụrụ ọhụrụ ga-adị nʼọnwa ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmiri si nʼebe nsọ ahụ na-agba ha mmiri. Mkpụrụ ha ga-abụ nri, akwụkwọ ha ga-abụkwa maka ịgwọ ọrịa.”


Ma nwanyị ahụ zoro mmadụ abụọ ahụ. Mgbe ndị ahụ e ziri ozi bịarutere, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ eziokwu na ndị ikom ahụ bakwutere m, ma amaghị m ebe ha si bịa.


(Nʼeziokwu ọ bụ Rehab nʼonwe ya mere ka mmadụ abụọ ahụ rigoro nʼelu ụlọ ebe o zoro ha nʼokpuru ahịhịa flakisi ọ wụsara nʼebe ahụ.)


Ya mere, ndị ikom ahụ pụrụ na-achụ ndị nnyopụta ahụ nʼakụkụ ụzọ gara ngabiga Jọdan. Ma ngwangwa ha pụrụ, e mechiri ọnụ ụzọ ama e si abata obodo ahụ.


A naghị emechi ọnụ ụzọ ama obodo ahụ emechi. Ha na-eghe oghe ụbọchị niile nʼihi abalị ọbụla adịghịkwa nʼebe ahụ.


Mgbe ndị agha ahụ bịaruru ijide Devid na ịkpụgara ya Sọl, Mikal gwara ha sị, “Ahụ esighị ya ike.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan