Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 2:3 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Mgbe eze Jeriko nụrụ okwu a, o zigaara Rehab ozi sị, “Kpọpụta ndị ikom ahụ batara nʼụlọ gị nʼihi na ha bịara iledo ala anyị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

3 Eze Jeriko we zigara Rehab ozi, si, Me ka ha puta, bú ndikom ahu ndi bakutere gi, ndi bara n'ulo-gi: n'ihi na ọ bu ileputa ala nka nile ka ha biaworo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 2:3
15 Iomraidhean Croise  

Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ozi ruru Juda ntị sị, “Tama nwunye nwa gị gbara akwụna, bịa site nʼịgba akwụna dịrị ime.” Juda sịrị, “Kpọpụtanụ ya ka akpọọ ya ọkụ.”


Ma anyị gwara ya sị, ‘Anyị bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi, ndị na-abụghị ndị nnyopụta obodo.


ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na Devid eziteghị ha ịbịakwute gị, naanị ka ha bịa mee nledo nʼobodo a, nyochapụta ya ma kwatuo ya?”


Mgbe ndị ozi Absalọm bịaruru jụọ nwanyị ahụ, “Olee ebe Ahimaaz na Jonatan nọ”? Nwanyị ahụ zara, “Ha agafeela mmiri iyi.” Ndị ozi Absalọm chọrọ ha ma ha ahụghị ha. Ha laghachiri na Jerusalem.


ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn, bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na ndị ozi ya abịakwuteghị gị, naanị ka ha mee nledo, nyochapụta otu obodo a dị ma kwatuo ya?”


na a na-echebe ndị ọjọọ pụọ nʼụbọchị nhụju anya, na a na-anapụta ha site nʼụbọchị oke iwe?


“Kpụrụ onye nkwulu ahụ gaa nʼazụ obodo. Ndị niile nụrụ okwu ahụ o kwuru ga-ebikwasị ya aka ha nʼisi. Mgbe ahụ, ọgbakọ Izrel niile ga-eji nkume tugbuo ya.


Pailet pụkwara nʼezi ọzọ sị ha, “Lee, ana m akpọpụtara unu ya, ka unu mara na achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọbụla o mere.”


Mgbe o jidere ya, o tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ ebe o mere ka ndị agha chee ya nche, ndị agha anọ nʼotu oge, ndị agha anọ ọzọ nʼoge nke ọzọ. Ebumnobi ya bụ ịkpọpụta ya nʼihu ọha mmadụ kpee ya ikpe mgbe Mmemme Ngabiga gasịrị.


Ma nʼabalị na-esota ụbọchị ahụ Herọd ga-akpụpụta ya, Pita nọ nʼụra nʼetiti ndị agha abụọ, e jiri eriri igwe kee ya nʼụkwụ nʼaka, ma ndị nche ọzọ nọkwa nʼọnụ ụzọ na-eche ya nche.


Ya mere, ha kpọpụtara ndị eze ise ahụ site nʼọgba nkume ahụ, ha bụ eze Jerusalem, na eze Hebrọn, na eze Jamut, na eze Lakish, na eze Eglọn.


Ma otu onye gwara eze Jeriko okwu sị, “Lee, ụfọdụ ụmụ ndị ikom Izrel batara obodo a nʼabalị inyochapụta ala anyị.”


Ma nwanyị ahụ zoro mmadụ abụọ ahụ. Mgbe ndị ahụ e ziri ozi bịarutere, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ eziokwu na ndị ikom ahụ bakwutere m, ma amaghị m ebe ha si bịa.


Sisera gwara nwanyị ahụ bụ Jael okwu sị, “Guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ a. Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa jụọ gị, ‘O nwere onye gbabatara nʼebe a?’ sị ya, ‘Mba.’ ”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan