Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 2:23 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Emesịa, mmadụ abụọ ahụ e zipụrụ iledo ala ahụ anya sitere nʼebe ha zoro onwe ha rịpụta, gafee osimiri Jọdan, laghachi nʼebe ụmụ Izrel nọ. Ha bịara kọọrọ Joshua nwa Nun otu ha si gaa ije ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

23 Ndikom abua ahu we laghachi, si n'ugwu ahu rida, we gabiga, biakute Joshua nwa Nun; ha we kọrọ ya ihe nile nke dakwasiri ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 2:23
4 Iomraidhean Croise  

Ndị ikom abụọ ahụ gara zoo onwe ha nʼugwu ahụ. Ha nọrọ ụbọchị atọ nʼebe ahụ dịka Rehab gwara ha, tutu ndị ahụ na-achụ ha laghachiri nʼobodo Jeriko. Ndị a chọọrọ ha gaa ebe niile, nʼokporoụzọ niile, ma ha ahụghị ha.


Ha gwara Joshua sị, “Nʼezie, Onyenwe anyị enyela anyị ala ahụ niile, nʼihi na ndị niile bi nʼala ahụ na-atụ anyị ụjọ.”


Mgbe unu ruru ebe ahụ, unu ga-ahụ ndị na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla, na ala sara mbara nke Chineke na-etinye unu nʼaka. Ala nke ihe ọbụla na-adịghị akọ nʼime ya.”


Ha zara sị, “Bịanụ, ka anyị gaa buso ha agha. Anyị ahụla ala ahụ, ọ dịkwa mma nke ukwu. Gịnị ka unu na-agbara nkịtị? Unu egbula oge ịba nʼebe ahụ nweta ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan