Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 2:1 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Joshua nwa Nun sitere na Shitim zipụ ndị nnyopụta abụọ na nzuzo sị ha, “Gaanụ leta otu ihe si aga nʼala ahụ, karịsịa nʼobodo Jeriko.” Ha gara nʼobodo ahụ baa nʼụlọ nwanyị akwụna aha ya bụ Rehab nọọ ọnọdụ nʼebe ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

1 Joshua nwa Nun we si na Shitim zipu ndikom abua na nzuzo, bú ndi-nledo, si, Jenu, le ala ahu, na Jeriko. Ha we je, ba n'ulo otù nwayi nākwa iko, aha-ya bu Rehab, ha we dina n'ebe ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 2:1
23 Iomraidhean Croise  

Zipụnụ otu onye nʼime unu ka ọ gaa kpọta nwanne unu nwoke. Ma aga m etinye ndị fọdụrụ nʼụlọ mkpọrọ, tutu m chọpụta ma ihe unu kwuru ọ bụ eziokwu maọbụ ụgha. Ọ bụrụ ụgha nʼezie, dịka Fero na-adị ndụ, unu bụ ndị nnyopụta.”


Josef chetakwara nrọ ndị ahụ ọ rọrọ banyere ha. Ọ gwara ha okwu sị ha, “Unu bụ ndị nnyocha. Ịchọpụta adịghị ike ala anyị mere unu ji bịa.”


Ndị m, chetanụ ihe Balak eze Moab zubere na ihe Belam nwa Beoa zara ya. Chetanụ njem unu site nʼobodo Shitim ruo obodo Gilgal, ka unu hụ nzọpụta nke Onyenwe anyị.”


Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,


“Ziga ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa legharịa anya nʼala Kenan, ala ahụ m na-enye Izrel. Ziga mmadụ iri na abụọ, otu onyendu site nʼebo Izrel ọbụla.”


Mgbe Izrel bi na Shitim, ndị ikom ha malitere isoro ndị inyom Moab na-akwa iko.


Mgbe ha nọ nʼebe a, ha manyere ụlọ ikwu ha nʼebe dị iche iche nʼakụkụ osimiri Jọdan, site na Bet-Jeshimọt rute rịị ebe a na-akpọ Ebel-Shitim, nʼobosara ala Moab.


Salmọn bụ nna Boaz, site na nwunye ya Rehab, Boaz mụrụ Obed, site na nwunye ya Rut, Obed amụọ Jesi.


“Ana m ezipu unu dị ka atụrụ nʼetiti agụ. Ya mere, nweenụ uche dịka agwọ. Burunu ndị a na-apụghị ịta ụta dịka nduru.


Matanụ nke ọma na onye na-akwa iko, maọbụ onye rụrụ arụ, maọbụ onye anya ukwu, nʼihi na anya ukwu dị ka ikpere arụsị, enweghị ike ịbata nʼalaeze Kraịst na Chineke.


Site nʼokwukwe, Rehab nwanyị akwụna esoghị ndị nnupu isi laa nʼiyi nʼihi na ọ nabatara ndị bịara inyochapụta obodo ahụ nʼudo.


Nʼotu ụzọ ahụ, agụnyeghị Rehab, nwanyị akwụna ahụ nʼonye ezi omume nʼihi ọrụ ọ rụrụ, mgbe ọ kpọbatara ndị nnyopụta ahụ ma zipụkwa ha site nʼụzọ dị iche?


Onye ọbụla nupuru isi nʼiwu i nyere anyị, ọ ga-anwụ. Naanị dịrị ike, nweekwa obi ike.”


Ma otu onye gwara eze Jeriko okwu sị, “Lee, ụfọdụ ụmụ ndị ikom Izrel batara obodo a nʼabalị inyochapụta ala anyị.”


Helkat na Rehob, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, obodo anọ.


Nʼisi ụtụtụ, Joshua na ụmụ Izrel niile hapụrụ Shitim bịaruo nʼakụkụ osimiri Jọdan, maa ụlọ ikwu nʼebe ahụ. Nʼebe a ka ha nọ chere tutu ruo mgbe ha ga-agafe.


Mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal nʼala ihe nʼadịghị nke Jeriko, ha mere Mmemme Ngabiga nʼuhuruchi nke ụbọchị iri na anọ nke ọnwa ahụ.


Mgbe ha zipuru ndị ikom ịga nyochapụta obodo Betel, nke a na-akpọ Luz,


Mmadụ ise ndị ahụ gara nnyochapụta ala (ya bụ ala Laish) ahụ gwara ụmụnna ha sị, “Unu maara na nʼime otu ụlọ ndị a na e nwere efọọd, nʼụfọdụ arụsị ezinaụlọ ndị dị iche iche, na oyiyi a kpụrụ akpụ nke eji ọla wuo? Ugbu a, maranụ ihe unu ga-eme.”


Mgbe ahụ, ndị nnyocha ise ahụ banyere nʼime ụlọ ahụ buru arụsị ọla ahụ, na efọọd ahụ, na arụsị ezinaụlọ ndị ahụ, ma onye nchụaja ahụ na narị ndị agha isii ndị ji ngwa agha guzo nʼọnụ ụzọ ama.


Nʼihi nke a, ebo Dan sitere nʼikwu ise dị nʼebo ha họpụta mmadụ ise. Ndị a bụ dimkpa, na dike nʼagha, bụrụkwa ndị si nʼobodo Zora na Eshtaol. Ha zipụrụ mmadụ ise ndị a ka ha gaa nyochaa ala ahụ ha na-achọ ibi nʼime ya. Mgbe ndị ahụ jeruru obodo ugwu ugwu Ifrem, ha gara nọdụ ọdụ abalị nʼụlọ Maịka.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan