Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 18:7 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ma ndị Livayị agaghị eketa ala ọbụla nʼetiti unu, nʼihi na ihe nketa ha bụ ọrụ nchụaja ha na-arụ nʼihu Onyenwe anyị. Ebo Gad, na Ruben, na ọkara ebo Manase agaghị enwetakwa oke ọzọ, nʼihi na ha anarala ihe nketa nke ha nʼofe Jọdan, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe Mosis onyeozi Onyenwe anyị kwere ha na nkwa na ha ga-ebi.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

7 N'ihi na ndi Livai enweghi òkè n'etiti unu; n'ihi na ọlu-nchu-àjà Jehova bu ihe-nketa-ha: Gad na Reuben na nkera ebo Manase anarawo kwa ihe-nketa-ha n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, nke Moses, bú orù Jehova nyere ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 18:7
11 Iomraidhean Croise  

Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị ya, “Unu agaghị enwe ihe nketa nke ala, a gaghị ekenyekwa unu ala ọbụla nʼala Izrel niile. Nʼihi na mụ onwe m bụ oke na ihe nketa unu nwere nʼetiti ụmụ Izrel.


Ọ bụ naanị ụmụ Livayị ga-arụ ọrụ nʼụlọ nzute ahụ. Ha ka ọ dịrị ibu ahụhụ ajọ omume ọbụla banyere ejezighị ozi nke ụlọ nzute. Ụkpụrụ a ga-adị ebighị ebi ruo ọgbọ niile dị nʼihu. Ndị Livayị agaghị enwe ihe nketa nke aka ha nʼetiti ụmụ Izrel.


Ma ọ bụ naanị gị, na ụmụ gị ndị ikom, ga-aga ozi dịka ndị nchụaja, ozi metụtara ebe ịchụ aja, na ihe niile dị nʼazụ akwa mgbochi ahụ. Ana m enye gị ọrụ nchụaja dịka onyinye. Onye ọbụla ọzọ bịara nso ebe nsọ ahụ ga-anwụ.”


Ọ bụ nke a mere ndị Livayị enweghị oke maọbụ ihe nketa nʼetiti ndị Izrel ibe ha; Onyenwe anyị bụ ihe nketa ha, dịka Onyenwe anyị Chineke unu gwara ha.)


Ọ bụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị, na ụmụ Izrel, lara eze abụọ ndị a nʼiyi. Mosis nyekwara ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase ala ha.


Ma Mosis enyeghị ebo Livayị ala ọbụla, nʼihi na ọ gwara ha na Onyenwe anyị, Chineke Izrel bụ ihe nketa ha nwere, dịka o kwere ha na nkwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan