Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 17:1 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Nke a bụ oke e kenyere ndị ebo Manase, bụ ọkpara Josef, ya bụ Makia ọkpara Manase, onye bụ nna nna ndị Gilead. Onye natara ala Gilead na Bashan, nʼihi na ndị agbụrụ Makia bụ dike nʼagha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

1 Ife-nzà nke mara ebo Manase di kwa: n'ihi na ya onwe-ya bu ọkpara Josef. Ọ diri Makia ọkpara Manase, bú nna Gilead, n'ihi na onye ahu bu onye-agha, o we nwe Gilead na Beshan.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 17:1
20 Iomraidhean Croise  

Josef gụrụ ọkpara ya Manase, nʼihi na ọ sịrị, “Chineke emeela ka m chefuo ahụhụ m niile, mekwa ka m chefuo ndị ezinaụlọ nna m.”


Josef gụrụ nwa ya nke abụọ Ifrem. Ọ sịrị, “Nʼihi na Chineke emeela ka m mịa mkpụrụ nʼala nke ahụhụ m.”


Nʼala Ijipt, a mụụrụ Josef Manase na Ifrem, site na nwunye ya Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On.


O wutere Josef mgbe ọ hụrụ na nna ya bikwasịrị aka nri ya nʼisi Ifrem. O jidere aka nna ya iwepụ ya nʼisi Ifrem, ka ọ tụkwasị ya nʼisi Manase.


Mgbe ahụ, Josef sịrị nna ya, “I bikwasịjọrọ aka gị. Onye a bụ ọkpara, bikwasị aka nri gị nʼisi ya.”


Josef hụrụ ụmụ Ifrem, na ụmụ ụmụ ya. Ọ nọkwa ndụ hụ ụmụ Makia nwa Manase, ndị e kukwasịrị nʼikpere ya.


Ọ nọrọ nʼebe ahụ mee ya eze ndị Gilead, ndị Ashuri na ndị Jezril; na ndị Ifrem, ndị Benjamin na Izrel niile.


Ma Geshua na Aram dọtara obodo Jaịa nʼagha, dọtakwa Kenat nʼagha, ya na iri obodo nta isii ndị ọzọ gbara ya gburugburu. Ndị a niile bụ ụmụ Makia nna Gilead.


Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Nke a ga-abụ oke ala nke unu ga-eke nʼetiti ebo iri na abụọ nke Izrel dịka ihe nketa ha, Josef ga-enweta oke ala abụọ.


Manase nwere otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Naftalị, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.


Ụmụ ụmụ Manase bụ ndị a: ndị Makia, site nʼikwu Makia. Makia bụ nna Gilead. Ikwu Gilead, site na Gilead.


Ụmụ ndị inyom Zelofehad nwa Hefa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase bụ ndị si nʼagbụrụ Manase nwa Josef. Aha ndị inyom ndị a bụ: Mahla, Noa, Hogla, Milka na Tịaza. Ha bịara,


Mosis nyere ndị ebo Gad, na Ruben, na ọkara Manase nwa Josef, alaeze niile Saịhọn eze Amọrị nakwa alaeze niile nke Ọg, eze ndị Bashan na-achị. O nyere ha ala ahụ niile, na obodo niile dị nʼala ahụ gburugburu.


Ọ ga-anabata nwa nwoke nke nwanyị ahụ ọ na-ahụghị nʼanya mụtara dị ka ọkpara, nye ya, oke abụọ site nʼihe niile o nwere. Nʼihi na nwoke ahụ bụ mmalite ume ya, ọnọdụ nke ị bụ ọkpara bụkwa nke ya.


Ya mere, oke a dịịrị ndị fọdụrụ nʼebo Manase dịka ezinaụlọ ha si dị. Agbụrụ Abieza, Helek, Asriel, Shekem, Hefa na Shemida. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom agbụrụ Manase, nwa Josef, dịka ikwu ha si dị.


Ọkara ebo Manase ka Mosis nyere ihe nketa nke ha nʼime ala Bashan, ma ọkara ebo Manase nke ọzọ nwetara ihe nketa nke ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Mgbe Joshua na-ezilaga ha nʼụlọ ha, ọ gọziri ha, gwa ha okwu sị,


Ụfọdụ si Ifrem bịa, bụ ndị ahụ nwere mgbọrọgwụ nʼala ndị Amalek, ndị Benjamin sokwa pụta, ndị ndu sikwa Makia bịa, ndị na-eso ndị ndu sikwa Zebụlọn pụta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan