Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 16:8 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Oke ala ahụ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ sitere na Tapụọa gaa ruo iyi Kana, na ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ ala ebo Ifrem ketara, dịka ikwu ha si dị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

8 Ókè-ala ahu siri na Tapua je n'akuku Ọdida-anyanwu rue miri-iyi Kena; ọpupu-ya we di n'oké osimiri. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Efraim dika ab͕uru nile ha si di;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 16:8
10 Iomraidhean Croise  

Ọ nọrọ nʼebe ahụ mee ya eze ndị Gilead, ndị Ashuri na ndị Jezril; na ndị Ifrem, ndị Benjamin na Izrel niile.


Betel na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ya bụ Naaran, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na Gaza na obodo nta ya, ndị dị nʼọdịda anyanwụ, na Shekem, na obodo ndị ọzọ, tutu ruo Aya, na obodo nta ya niile, so nʼala ha.


Ifrem ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Manase, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.


Oke ala unu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Nke a ga-abụ oke ala unu.


eze Tapụọa, otu eze Hefa, otu


E tinyere obodo ukwu na obodo nta niile ekepụtara iche nʼihi ebo Ifrem nʼetiti ihe nketa ụmụ Manase.


Oke ala ebo Manase gbatịrị site nʼAsha ruo na Mikmetat, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Shekem. Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ndịda site nʼebe ahụ tinyere ndị bi nʼala En-Tapụọa.


Ọ gara ruo Ebrọn, Rehob, Hamọn na Kana, ruokwa ebe obodo Saịdọn gbasapụrụ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan