Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 15:4 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 site nʼebe ahụ ruo Azmọn, pụọ gbasoro iyi dị nʼoke ala ndị Ijipt gagide ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala nʼebe ndịda.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

4 o we gabiga rue Azmon, pua na miri-iyi Ijipt; ọpupu ókè-ala ahu we di n'oké osimiri: nka gāburu unu ókè-ala Ndida.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 15:4
8 Iomraidhean Croise  

Nʼụbọchị ahụ ka Onyenwe anyị na Ebram gbara ndụ. Ọ sị, “Ndị agbụrụ gị ka m ga-enye ala ndị a, malite nʼiyi ndị Ijipt ruo nʼiyi ukwu Yufretis.


Ya mere, Solomọn ya na ndị Izrel niile mere mmemme a nʼoge ahụ, ọ bụ nzukọ dị ukwuu. Ndị mmadụ bịara sitere na Lebo Hamat ruo na mmiri iyi Ijipt. Ha mere mmemme a nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị, ụbọchị asaa tinyere ụbọchị asaa ọzọkwa, ya bụ agụkọta ha ụbọchị iri na anọ.


“Aga m etinye oke ala unu site nʼOsimiri Uhie ruo nʼosimiri Mediterenịa, sitekwa nʼọzara ruo nʼosimiri Yufretis. Aga m enyefe ndị niile bi nʼala ahụ nʼaka unu. Unu ga-achụpụkwa ha.


Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-ahọcha site nʼebe mmiri na-eru eru Yufretis ruo na Wadi nke Ijipt, ma gị, bụ Izrel ka a ga-achịkọta otu nʼotu.


ebe ọ ga-echigharị gbasoro iyi Wadi nke Ijipt ma kwụsị nʼosimiri Mediterenịa.


site nʼosimiri Shaịho dị nʼọnụ Ijipt ruo nʼoke ala Ekrọn, nʼakụkụ ugwu ya, nke a gụnyere ndị Kenan, na ndịisi ise ndị Filistia: ndị Gaza, ndị Ashdọd, ndị Ashkelọn, ndị Gat, na ndị Ekrọn; nakwa ala ndị Ava,


Site nʼebe akụkụ ndịda nrigo Akrabim, gafee ruo nʼọzara Zin, ma rigoo nʼakụkụ nke ndịda Kadesh Banea, gafee Hezrọn rigoruo na Aada, gba gburugburu gaa Kaka;


Ma Ashdọd nʼonwe ya, na ụmụ obodo nta ya niile, na Gaza na obodo nta ya niile, ruo nʼiyi Ijipt, na ruo nʼoke osimiri Mediterenịa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan