Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 15:1 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ala ndị a ka e nyere ndị Juda dịka ikwu dị nʼebo ahụ si dị. Ikwu ọbụla ketara ala nke ha site nʼife nza. Ala Juda gbatịrị nnọọ ruo nʼoke ala Edọm, gbatịakwa ruo nʼọzara Zin, kwụsị nʼọnụ ọnụ ndịda ọzara a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

1 Ife-nzà nke mara ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di we dirue ókè-ala Edom, rue ọzara Zin n'akuku Ndida, na nsọtu Ndida.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 15:1
13 Iomraidhean Croise  

Ụmụ Lịa bụ, Ruben, ọkpara Jekọb. Simiọn, Livayị, Juda, Isaka na Zebụlọn.


Ya mere, Solomọn ya na ndị Izrel niile mere mmemme a nʼoge ahụ, ọ bụ nzukọ dị ukwuu. Ndị mmadụ bịara sitere na Lebo Hamat ruo na mmiri iyi Ijipt. Ha mere mmemme a nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị, ụbọchị asaa tinyere ụbọchị asaa ọzọkwa, ya bụ agụkọta ha ụbọchị iri na anọ.


Oke ala na ndịda, ọ ga-esite na Tama ruo ọbụladị mmiri Meriba Kadesh, soro ụzọ ọdọ mmiri iyi Ijipt ruo osimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala ahụ na ndịda.


Juda ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Ruben, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.


Ma mgbe anyị tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ nụrụ akwa anyị, zitere anyị mmụọ ozi ya, onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt. “Ugbu a, anyị nọ na Kadesh obodo dị nso nʼoke ala gị.


Mgbe ha nụrụ ihe niile ọ na-eme, ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya site na Judịa, na Jerusalem, na Idumia na obodo ndị dị nʼofe Jọdan, na gburugburu Taịa na Saịdọn.


Nʼihi na gị na Erọn jụrụ irubere m isi nʼihu ụmụ Izrel, na mmiri Meriba Kadesh, nke dị nʼọzara Zin, unu edoghị m nsọ nʼihu ndị Izrel.


Ebo ọbụla nʼime ebo itoolu na ọkara ahụ fọdụrụ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.


Nʼakụkụ ndịda, oke ala ha malitere nʼọnụ ọnụ ndịda osimiri Nnu.


Ha ga-eke ala ahụ fọdụrụ ụzọ asaa. Ma ebo Juda ga-anọgide nʼala ha nʼakụkụ ndịda, ụmụ ụmụ Josef kwa ga-anọgide nʼala ha nʼakụkụ ugwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan