Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 14:9 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Mosis ṅụrụ iyi sị m, ‘Ebe ọ bụ na i ji obi gị niile soro Onyenwe anyị Chineke m, ala ahụ i jegharịrị ije nʼelu ya ga-abụ ihe nketa nye gị na ụmụ gị ruo mgbe ebighị ebi.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

9 Moses we ṅua iyi n'ubọchi ahu, si, Ala nke i zọkwasiri ukwu aghaghi iburu gi na umu-gi ihe-nketa rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na i sozuwo Jehova, bú Chinekem, n'azu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 14:9
8 Iomraidhean Croise  

Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi, ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha.


Ha gara site na Negev rute Hebrọn, ebe Ahiman na Sheshai na Talmai, ụmụ ụmụ Anak bi. (Ma ewuru Hebrọn afọ asaa tupu e wuo obodo Zoan dị nʼIjipt.)


karịakwa Kaleb, nwa Jefune. Ọ ga-ahụ ala ahụ anya, aga m enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ọ zọkwasịrị ụkwụ ya, nʼihi na o ji obi ya niile sogide Onyenwe anyị.”


Ebe ọbụla unu zọnyere ụkwụ unu nʼala ahụ aghọọla nke unu, site na ndịda Negeb ruo Lebanọn, sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo Osimiri Mediterenịa. Ha ga-abụ nke unu.


Ana m agwa gị ihe m gwara Mosis mgbe ọ dị ndụ sị, Ebe ọbụla unu ga-azọkwasị ụkwụ unu nʼala, ala ahụ ga-abụ nke unu.


“Ugbu a, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa, o meela ka m dị ndụ. Nke a bụ iri afọ anọ na ise kemgbe Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ndị a, mgbe Izrel na-awagharị nʼọzara. Ma ugbu a, lee, agbaala m iri afọ asatọ na ise taa.


E nyekwara Kaleb obodo Hebrọn, dịka Mosis kwere ya na nkwa. Kaleb chụpụrụ ụmụ Anak atọ site nʼala ahụ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan