Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 13:7 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ya mere, kere ebo itoolu, na ọkara Manase, ala ndị a niile, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

7 Ma ub͕u a kère ebo iteghete na nkera ebo Manase ala nka n'ihe-nketa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 13:7
12 Iomraidhean Croise  

o nyere ha ala niile nke mba dị iche iche, ha ghọrọ ndị nnweta nke ihe ndị ọzọ rụpụta,


Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha, tụọ ala ha kesara ha dịka ihe nketa; o mere ka ebo niile nke Izrel biri nʼụlọ nke aka ha.


“ ‘Mgbe unu ga-eke ala ahụ dịka ihe nketa, unu ga-ebu ụzọ nye Onyenwe anyị otu oke nʼime ya ka ọ bụrụ oke dị nsọ nke ala ahụ. Ogologo ya ga-adị kilomita iri na atọ, obosara ya ga-abụ kilomita iri na otu. Ihe dị nsọ ka ala ahụ niile ga-abụ gbaa gburugburu.


Unu ga-eke ala ahụ site nʼife nza, dịka agbụrụ unu niile si dị. Ndị bara ụba nye ha ihe nketa dị ukwuu, ndị dị ole na ole nye ha ihe nketa dị nta. Ihe ọ bụla ruuru agbụrụ ọbụla site nʼife nza ga-abụ nke ha. Kee ya dịka ebo nna nna unu ha si dị.


Mosis nyere ndị Izrel iwu sị, “Kesaanụ ala a dịka ihe nketa site nʼife nza. Onyenwe anyị enyela iwu ka enye ya ebo itoolu na ọkara ndị ahụ fọdụrụ.


“Ndị niile bi nʼala ugwu site na Lebanọn ruo Mizrefot Maim, ya bụ, ndị Saịdọn niile, Mụ onwe m ga-achụpụ ha site nʼihu ụmụ Izrel. Ihe dịrị gị bụ ike ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa nye ndị Izrel, dịka mụ onwe m nyere gị iwu.


Ọkara ebo Manase, na ebo Ruben, na Gad, enwetala ihe nketa ha nʼofe ọzọ nke Jọdan, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ha.


Ebo ọbụla nʼime ebo itoolu na ọkara ahụ fọdụrụ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan