Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 13:11 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ọ gụnyekwara Gilead, nʼoke ala ndị Geshua, na ndị Maaka, na ugwu Hemon niile, na Bashan niile, ruokwa Saleka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

11 na Gilead, na ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na ugwu Heamon nile, na Beshan nile rue Saleka;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 13:11
13 Iomraidhean Croise  

Mgbe ha nọdụrụ ala bido iri nri, ha leliri anya ha hụ igwe ndị ahịa Ishmel si Gilead. Ịnyịnya kamel ha bu ụda na mgbaa na máá. Ọ bụkwa Ijipt ka ha bu ihe ndị a na-aga.


Ma Geshua na Aram dọtara obodo Jaịa nʼagha, dọtakwa Kenat nʼagha, ya na iri obodo nta isii ndị ọzọ gbara ya gburugburu. Ndị a niile bụ ụmụ Makia nna Gilead.


Ụmụ Gad bi nʼakụkụ ha site na Bashan ruo Saleka.


Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na ndị ebo Gad na Ruben, onye ọbụla nke jikere ịga agha, ga-eso unu gafee Jọdan nʼihu Onyenwe anyị, mgbe ahụ, oge unu lụgburu ndị ala ahụ niile, unu aghaghị inye ha ala Gilead dịka ihe nketa ha.


Anyị meriri obodo ndị ahụ niile dị nʼala dị larịị, meriekwa Gilead niile na Bashan, tutu ruo obodo Saleka na Edrei, obodo ndị dị nʼalaeze Ọg, eze Bashan.


zigakwara eze ndị Kenan ndị bi nʼọwụwa anyanwụ, na ọdịda anyanwụ, zigakwara eze ndị Amọrait, na eze ndị Het, na eze ndị Periz, na nke ndị Jebus nke dị nʼala ugwu. O zigakwara eze ndị Hiv ndị bi na ndịda Hemon, na mpaghara Mizpa.


Ọ gbatịkwara ruo nʼoke ala ndị Amọn, tinyere obodo niile nke Saịhọn, eze ndị Amọrait na-achị mgbe o bi na Heshbọn.


“Ndị a bụ ala nke fọdụrụ unu ga-enweta: “ala ndị Filistia niile na ala ndị Geshua niile,


Ndị a bụ ala ebo Gad nwetara: ala ahụ niile dị na Jeza, na obodo Gilead niile, na ọkara ala ndị Amọn nke ruru Areoa, nʼakụkụ Raba.


Manase chịtara ala oke iri, tinyere Gilead, na Bashan nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan,


Ndị Hibru ụfọdụ gafere Jọdan ruo nʼala Gad na Gilead. Nʼoge a, Sọl nọ na Gilgal, ndị agha niile ya na ha nọ na-amakwa jijiji nʼihi ụjọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan