Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 11:16 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ya mere, Joshua meriri ala ahụ niile, bụ ala ugwu ugwu ahụ, na ala Negeb, na ala Goshen, na obosara ala ọdịda anyanwụ ahụ niile, na ala Araba, na ala ugwu ahụ niile, na ala ahụ dị na mgbada ugwu Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

16 Joshua we were ala ahu nile, bú ugwu, na Negeb nile, na ala Goshen nile, na ebe di ala ala, na Araba, na ugwu Israel, na ebe di ala ala ya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 11:16
16 Iomraidhean Croise  

o nyere ha ala niile nke mba dị iche iche, ha ghọrọ ndị nnweta nke ihe ndị ọzọ rụpụta,


Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha, tụọ ala ha kesara ha dịka ihe nketa; o mere ka ebo niile nke Izrel biri nʼụlọ nke aka ha.


Ọ bụ nʼelu ugwu niile nke Izrel ka m ga-akụnye ya. Ọ ga-awapụtakwa alaka ya, mịa mkpụrụ, bụrụkwa sida mara oke mma. Ụmụ nnụnụ dị iche iche ga-ewu akwụ ha na ya, ha ga-achọtakwa ebe obibi na ndo nke alaka ya niile.


“ ‘Ma unu, ugwu niile nke Izrel ga-awapụta ngalaba, mịakwa mkpụrụ nke ndị m ga-eri, nʼihi na oge ha ga-alọghachi adịghịkwa anya.


Ugbu a bilienụ ije, baa nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait. Gaakwanụ nʼala niile ndị agbataobi ha bụ Araba, nʼugwu niile na nʼebe dị ala ala na Negeb, nʼọnụ mmiri nke oke osimiri, garuokwanụ ala ndị Kenan na nke ndị Lebanọn, gagidekwanụ ruo nʼosimiri ukwu Yufretis.


Ya mere, Joshua na ndị agha ya meriri obodo ahụ niile, na ala ahụ niile. O meriri eze niile nke obodo ugwu ahụ, na ndị bi na Negeb, na mgbada ala ugwu dị nʼọdịda anyanwụ, na mgbada ala ugwu ugwu ahụ. O gbuchara mmadụ niile bi nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya iwu.


Joshua tigburu ha niile site na Kadesh Banea ruo Gaza, sitekwa na Goshen ruo Gibiọn.


Nʼihi na nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis onyeozi ya. Mosis nyekwara Joshua otu iwu a. Ugbu a Joshua emeela dịka a gwara ya. O mezuru ihe ndị a niile, bụ nke Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.


na ndị eze bi nʼobodo ugwu ugwu, na ndị bi nʼime Araba, na ndịda Kineret, na ndagwurugwu ọdịda anyanwụ, na nʼime Nafọt Doa, nke dị nʼọdịda anyanwụ,


Nʼoge ahụ kwa, Joshua gara kpochapụ ndị Anak ahụ bi nʼala ugwu ugwu, ya bụ, na Hebrọn, na Debịa, na Anab, na ala ugwu ugwu Juda, na ala ugwu ugwu Izrel. O gburu ha niile, laa obodo ha nʼiyi.


Ala ndị ọzọ bụkwa ala ugwu ugwu ahụ, na ala dị na mgbada ugwu ọdịda anyanwụ, na ala Araba, na ala ndị dị na mgbada ugwu, na ọzara, nakwa Negev. Ndị a bụ ala ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Kenan, ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Ndị a bụ ndị eze ahụ:


Mgbe eze ndị niile bi nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan, nụrụ banyere ihe ndị a, ya bụ, ndị niile bi nʼala ugwu ugwu nʼọdịda anyanwụ ndagwurugwu, na ndị bi ogologo akụkụ osimiri Mediterenịa ruo Lebanọn, eze ndị Het na nke ndị Amọrait na nke ndị Kenan na nke ndị Periz na nke ndị Hiv na nke ndị Jebus,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan