Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 10:6 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ma ndị Gibiọn mere ngwangwa zigara Joshua ozi nʼụlọ ikwu dị na Gilgal sị ya, “Bịa nyere ndị ohu gị aka. Bịa ngwangwa zọpụta anyị, nʼihi na eze niile nke ndị Amọrait, ndị bi nʼugwu, abịala nʼebe a, ha na ndị agha ha ibuso anyị agha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

6 Ndikom Gibeon we zigara Joshua ozi rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal, si, Arala ndi-orù-gi aka; rigokute ayi ngwa ngwa, zọputa ayi, ye-kwa-ra ayi aka: n'ihi na eze nile nke ndi-Amorait ndi bi n'ugwu achikọtawo onwe-ha imegide ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 10:6
14 Iomraidhean Croise  

Mgbe ahụ, ọ nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ibu ahụ, nye nwokorobịa ahụ iwu sị ya, “Gbasie ọsọ ike. Akwụsịkwala ịgba ọsọ ma ọ bụghị mgbe m gwara gị kwụsị.”


Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu, otu a ka Onyenwe anyị na-agba ndị ya gburugburu ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi.


Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ikpe anyị. Onyenwe anyị bụ onye na-enye anyị iwu. Onyenwe anyị bụ eze anyị, ọ bụ ya na-azọpụta anyị.


Ndị Amalek bi na Negev, ndị Het na ndị Jebus na ndị Amọrait bi nʼala ugwu ugwu. Ma nʼakụkụ osimiri Mediterenịan na ndagwurugwu mmiri Jọdan ka ndị Kenan bi.”


Nʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda.


Ya mere, a kpọọrọ m ndịisi nʼebo dị iche iche, ndị ikom maara ihe, na ndị a na-asọpụrụ, mee ka ha bụrụ ndịisi ọchịchị unu, ụfọdụ ha na-elekọta puku mmadụ, ụfọdụ narị mmadụ, ndị ọzọ na-elekọta iri mmadụ ise, ndị ọzọ mmadụ iri, ka ha bụrụ ndị ndu ebo dị iche iche.


Mgbe ahụ, eze ise ndị Amọrait ndị a, eze Jerusalem, na eze Hebrọn, na eze Jamut, na eze Lakish na eze Eglọn chịkọtara ndị agha. Ha na ndị agha ha gara were ọnọdụ ha imegide Gibiọn, ha lụsokwara ha ọgụ.


Joshua na ndị agha ya niile, tinyere ndị ahụ niile ibu agha were anya, hapụrụ Gilgal gawa ịzọpụta Gibiọn.


E kenyere ha obodo Kiriat Aaba, nke a na-akpọkwa Hebrọn. Obodo a dị nʼala ugwu ugwu Juda, ya na ala gbara ya gburugburu ka ọ bụrụ ebe ịta nri anụ ụlọ. (Aaba bụ nna nna ndị Anak.)


Mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal nʼala ihe nʼadịghị nke Jeriko, ha mere Mmemme Ngabiga nʼuhuruchi nke ụbọchị iri na anọ nke ọnwa ahụ.


Mgbe ahụ, Joshua na ndị ahụ gbara ndụ udo ikwe ka ha dị ndụ. Ndịisi nzukọ Izrel mesiri ọgbụgba ndụ ahụ ike site nʼịṅụ iyi.


Mgbe ha bịaruru nʼebe ndị Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal, ha jekwuuru Joshua, gwa ya na ndị Izrel okwu sị ha, “Anyị si nʼala dị anya bịa. Ugbu a, biko anyị chọrọ ka anyị na unu gbaa ndụ.”


Ha zara Joshua sị ya, “Anyị bụ ndị ohu unu.” Ma Joshua jụrụ ha ajụjụ sị, “Olee ndị unu bụ? Ebee ka unu si bịa?”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan