Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 10:41 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

41 Joshua tigburu ha niile site na Kadesh Banea ruo Gaza, sitekwa na Goshen ruo Gibiọn.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

41 Joshua we si na Kedesh-banea tib͕ue ha we rue Geza, na ala Goshen nile, we rue Gibeon.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 10:41
19 Iomraidhean Croise  

oke ala ndị Kenan sitere na Saịdọn ruo Gera, gbatịa ruo Gaza, ruokwa Sọdọm, Gọmọra, Adma na Zeboiim, nke dị nso Lasha.


Na Gibiọn, Onyenwe anyị mere ka Solomọn hụ ya anya na nrọ nke abalị, Chineke sịrị ya, “Rịọọ ihe ọbụla ị chọrọ ka m nye gị.”


Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme. Gaza kwa, ga-aṅagharị onwe ya nʼime oke ihe mgbu. Ọ bụladị Ekrọn ga-ama jijiji nʼụjọ mgbe ha hụrụ na olileanya ha agwụla. A ga-anapụ Gaza eze ya ma gbukwaa ya. Ọ dịghị onye ọbụla ga-ebikwa nʼAshkelọn.


Ha lọtara bịakwute Mosis na Erọn na nzukọ niile nke ụmụ Izrel, na Kadesh nke dị nʼọzara Paran. Ndị nledo ahụ kọrọ akụkọ otu ha si gaa nʼọgbakọ ụmụ Izrel niile. Gosikwa mkpụrụ osisi si nʼala ahụ.


Otu a ka nna unu ha mere mgbe m si Kadesh Banea zipụ ha inyocha ala ahụ.


gafee ndịda Akrabim, gabiga ruo ọzara Zin, gbada ndịda ruo Kadesh Banea. Site nʼebe ahụ ọ ga-aga ruo Haza Ada, gafee ruo Azmọn,


Mgbe ahụ mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Filip sị, “Gaa na ndịda, nʼụzọ ọzara nke siri Jerusalem gawa Gaza, ụzọ ahụ bụ ụzọ ọzara.”


Emesịa, dịka iwu Onyenwe anyị Chineke anyị nyere si dị, anyị hapụrụ ugwu Horeb, chee ihu gawa nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait. Ụzọ anyị si gafee ọzara ukwu ahụ dị egwu nke unu ji anya unu hụ tutu anyị erute Kadesh Banea.


Ebe ọzọkwa Onyenwe anyị mere ihe dị otu a bụ mgbe o mere ka ndị Kafto laa ndị Avim nʼiyi. Ha bichiri obodo nta niile ndị Avim nwere nke dị gburugburu ebe ahụ rukwaa Gaza.


Mgbe Onyenwe anyị si na Kadesh Banea zipụ unu ọ sị unu, “Gaanụ nweta ala ahụ m nyere unu.” Ma unu nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. Unu ekwenyeghị maọbụ rubere ya isi.


Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ndị Izrel lụgbuo ndị Amọrait. Joshua gwara Onyenwe anyị okwu nʼihu ndị Izrel niile sị, “Gị, anyanwụ, guzo nʼotu ebe na mbara eluigwe Gibiọn. Gị, ọnwa, guzokwa nʼotu ebe na mbara eluigwe na Ndagwurugwu Aijalon”


ọ tụrụ egwu nke ukwuu, ya na ndị ya. Nʼihi na Gibiọn bụ obodo a ma ama, dịka otu nʼime obodo ndị eze, ndị ikom ya bụkwa ndị dị ike, nʼihi na ọ dịkwa ukwuu karịa Ai. Ndị ikom ya niile maara otu e si ebu agha.


Ya mere, Joshua meriri ala ahụ niile, bụ ala ugwu ugwu ahụ, na ala Negeb, na ala Goshen, na obosara ala ọdịda anyanwụ ahụ niile, na ala Araba, na ala ugwu ahụ niile, na ala ahụ dị na mgbada ugwu Izrel.


Ọ dịkwaghị otu onye Anak a hapụrụ ndụ nʼoke ala Izrel niile, karịakwa ndị fọdụrụ na Gaza, na Gat, na nʼime Ashdọd.


Goshen, Họlọn na Gailo, ha niile dị obodo iri na otu tinyere obodo nta ha niile.


Otu ụbọchị, Samsin gara nʼotu obodo ndị Filistia a na-akpọ Gaza, soro otu nwanyị akwụna bi nʼebe ahụ hie ụra abalị.


Ndị Filistia jidere ya, ghụpụ ya anya ya abụọ, duru ya gbadata Gaza. Nʼebe ahụ, ha jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, nye ya ọrụ ịnyagharị igwe na-akwọ ọka nʼụlọ mkpọrọ ha tinyere ya.


Onyinye etuto ọlaedo ise a kpụrụ akpụ nke ha nyere Onyenwe anyị dị ka aja ikpe ọmụma nʼihi ihe mere ha bụ maka obodo ndị Filistia ndị a, Ashdọd, Gaza, Ashkelọn, Gat na Ekrọn.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan