Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 10:16 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ma nʼoge ahụ a na-alụ agha ahụ, ndị eze ise ahụ si nʼọgbọ agha gbapụ, zoo onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

16 Eze ise ndia we b͕alaga, zo onwe-ha n'ọb͕à na Makeda.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 10:16
17 Iomraidhean Croise  

ndị eze na ndị agha ha ji ọsọ gbalaa; ndị mmadụ kere ihe a dọtara nʼagha, nʼime ọmụma ụlọ ikwu.


Ọ bụladị mgbe ị na-arahụ ụra nʼetiti ọgba atụrụ, nku abụọ nke nduru m bụ ihe e ji ọlaọcha kpuchie, jirikwa ọlaedo nke na-enwuke kpuchie abụba ya.


Ọ bụrụ na ha egwuo ala ruo nʼala mmụọ, site nʼebe ahụ ka aka m ga-esi dọlie ha, ọ bụrụkwa na ha arịgoruo ime eluigwe, site nʼebe ahụ ka m ga-esi wedata ha nʼala.


Ha ga-aracha aja dịka agwọ, na dịka anụ dị iche iche, nke na-akpụ akpụ nʼala. Ha ga-eji ịma jijiji si nʼebe ha e wusiri ike pụta. Nʼihi egwu ha, ha ga-abịakwute Onyenwe anyị bụ Chineke anyị. Ha ga-atụkwa egwu gị.


Joshua na ndị Izrel niile laghachiri nʼọmụma ụlọ ikwu dị na Gilgal.


Mgbe ozi ruru Joshua ntị, na a chọtala eze ise ndị ahụ, ebe ha zoro onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda,


Mgbe ahụ, eze ise ndị Amọrait ndị a, eze Jerusalem, na eze Hebrọn, na eze Jamut, na eze Lakish na eze Eglọn chịkọtara ndị agha. Ha na ndị agha ha gara were ọnọdụ ha imegide Gibiọn, ha lụsokwara ha ọgụ.


Ndị eze niile nke ụwa na ndị nọ nʼọchịchị dị iche iche, na ndị ọgaranya, na ndị nọ nʼọnọdụ dị elu, na ndị ọchịagha, na ndị mmadụ niile dị iche iche, ndị ukwu ma ndị nta, ndị ohu na ndị nwe onwe ha, ha niile gara zoo onwe ha nʼime ọgba nkume na nʼokpuru ugwu,


Nʼihi na ndị Midia mekpara ha ahụ nke ukwuu, ụmụ Izrel meere onwe ha ebe obibi nʼugwu, nʼime ọgba nkume, na nʼebe e wusiri ike dị iche iche.


Mgbe ndị agha Izrel hụrụ na ọnọdụ ha dị njọ nke ukwuu, hụkwa na ndị iro na-emegide ha, ha zoro onwe ha nʼọgba nkume, nʼime oke ọhịa, nʼetiti nkume, nʼime olulu na nʼime oghere ọbụla.


Mgbe ọ bịaruru nso nʼọgba atụrụ nke dị nʼụzọ ahụ, otu ọgba nkume dị nʼebe ahụ, Sọl banyere nʼime ya, ịga mposi. Devid na ndị ikom ya nọ nʼime ime ọgba nkume ahụ.


Mgbe Sọl si nʼọgba nkume ahụ pụọ ịga nʼihu nʼije ya, Devid sitere nʼime ọgba nkume ahụ pụta, kpọọ Sọl oku sị ya, “Onyenwe m, eze!” Sọl tụgharịrị ma Devid kpọrọ isiala nye ya, daa nʼala kpuo ihu ya nʼala.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan