Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 10:13 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Anyanwụ guzoro, ọnwa guzokwa. Ha abụọ adaghị tutu ruo mgbe ndị agha mba ahụ gbuchasịrị ndị iro ha. Ihe banyere akụkọ agha a ka e dere nʼakwụkwọ Jasha. Ya mere, anyanwụ guzoro nʼotu ebe nʼetiti mbara eluigwe. Ọ nọkwa nʼotu ebe ihe dịka otu ụbọchị zuru ezu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

13 Anyanwu we guzo du, ọnwa guzo-kwa-ra, Rue mb͕e mba ahu bọsiri ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro-ha. Èdeghi nka n'akwukwọ Jasha? Anyanwu we guzo n'etiti elu-igwe, o meghi kwa ngwa ida ihe ra ka otù ubọchi zuru ezu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 10:13
29 Iomraidhean Croise  

O nyere iwu ka akụziere ndị Juda, abụ ùta a. E dere ya nʼime akwụkwọ Jesha.


Hezekaya zara sị, “Ọ dị mfe ka onyinyo gaa nʼihu nzọ ụkwụ iri. Ma mee ka onyinyo a laa azụ ihe nrigo iri.”


E kwukwara nʼakwụkwọ iwu ahụ na a ghaghị ịnabata iwu eze ahụ nʼobodo ọbụla dị nʼalaeze ya. E kwukwara na a ga-agụpụtara ya mmadụ niile, kọwazie ya ime ka ndị Juu niile nọdụ na njikere imeri ndị iro ha.


Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha; ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye.


Toonu ya, anyanwụ na ọnwa toonu ya, kpakpando niile.


Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ. Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.


Ọnwa ga-ada mba, anwụ ka ihere ga-eme; nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-achị nʼugwu Zayọn nakwa nʼime Jerusalem, ọ ga-eji oke ebube chịa nʼihu ndị okenye ya.


Aga m eme ka anyanwụ laa azụ nzọ ụkwụ iri nʼihe nrigo ụlọ elu Ehaz.’ ” Ya mere, anyanwụ laghachiri azụ nzọ ụkwụ iri.


Ala na-ama jijiji nʼihu ha, eluigwe na-emekwa mkpọtụ. Ihu anyanwụ na ihu ọnwa na-agbakwa ọchịchịrị, kpakpando adịghịkwa enye ìhè.


Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa oke egwu.


Anyanwụ na ọnwa ga-agbaji oji, kpakpando agakwaghị enye ìhè.


Anyanwụ na ọnwa guzokwara duu na mbara eluigwe, mgbe ha hụrụ ihe nke àkụ gị, mgbe ha hụrụ amụma nke ùbe gị gburu.


Nʼihi nke a, nʼAkwụkwọ Agha dị iche iche nke Onyenwe anyị na-asị, “Waheb nʼime Sufa ya na ndagwurugwu niile Anọn


“Taa ndị Midia ahụhụ, ka i si otu a bọọrọ ndị Izrel ọbọ ihe ọjọọ ndị Midia mere ha. Mgbe i mesịrị nke a, ị ga-anwụ.”


“Ngwangwa mgbe mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ niile gabigasịrị, “ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị. Ọnwa agaghị enyekwa ìhè, kpakpando ga-esi na mbara eluigwe daa, ike niile nke eluigwe ga-ama jijiji.’


Nke a ga-eme ka unu bụrụ ụmụ nke Nna unu bi nʼeluigwe, onye na-eme ka anwụ mụọrọ ndị ọma na ndị ọjọọ, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.


Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta ndị ahụ ọ họpụtara, bụ ndị na-akpọku ya ehihie na abalị? Ọ ga-anọ tee anya nʼinyere ha aka?


Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa ebube.


Mgbe ha si nʼihu Izrel gbapụ ọsọ nʼụzọ nrịda Bet-Horon na-aga Azeka, Onyenwe anyị sitere nʼelu na-atụdakwasị ha ọtụtụ mkpụrụ mmiri. Ọnụọgụgụ ndị mkpụrụ mmiri ndị a dagburu dị ukwuu karịa ndị ụmụ Izrel ji mma agha ha gbuo.


O nweghị ụbọchị ọzọ dịka ụbọchị ahụ nʼoge niile gara aga. Ọ dịbekwaghị ụbọchị yiri ụbọchị ahụ ruo taa. Ọ bụ ụbọchị Onyenwe anyị mere ka anyanwụ na ọnwa kwụsị, nʼihi naanị ekpere otu nwoke. Nʼihi na Onyenwe anyị na-eburu Izrel agha.


Ọ dịkwaghị mkpa ọ dịrị obodo ahụ ka anwụ maọbụ ọnwa mụkwasị ya, nʼihi na ebube nke Chineke bụ ìhè ya, oriọna ya bụkwa Nwa atụrụ ahụ.


Ha ji oke olu tie mkpu na-asị, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, onye dị nsọ na onye eziokwu, ruo olee mgbe ka ị na-eche ikpe ụwa na ndị bi nʼime ya ikpe ma bọọkwa ọbọ nʼisi ha maka ọbara anyị ha wufuru?”


Anọkwa m na-ele anya mgbe o meghere akara nke isii ahụ. Nke a mere ka oke ala ọma jijiji dịrị. Anyanwụ gbara ọchịchịrị dị ka akwa mkpe e jiri ajị mee. E mekwara ka ọnwa chaa uhie uhie dịka ọbara.


Mgbe mmụọ ozi nke anọ fụrụ opi ike ya, e mere ka otu akụkụ nʼime akụkụ atọ e kere anyanwụ gbaa ọchịchịrị. Otu a kwa, otu akụkụ nʼime akụkụ atọ e kere ọnwa gbara ọchịchịrị. Ya na otu akụkụ nʼime atọ e kere kpakpando niile. Nke a mere ka anyanwụ hapụ inyekwa ìhè ya nʼuju dịka o si eme na mbụ. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere ehihie ghọkwara oke ọchịchịrị, ọ dịkwa otu a nʼoge anyasị.


Mgbe ahụ, Samsin kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ sị, “O! Onyenwe m Onyenwe anyị, biko cheta m naanị otu ugbu a. Biko, Chineke, nye m ike nʼotu ohere a m nwere, ka m nwee ike ịbọrọ ọbọ nʼahụ ndị Filistia nʼihi, ọ bụladị, mkpụrụ anya m abụọ.”


“Mgbe ndị ndu na-edu nʼIzrel, mgbe ndị mmadụ jikwa afọ ofufu nye onwe ha, toonu Onyenwe anyị!


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan