Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 10:11 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Mgbe ha si nʼihu Izrel gbapụ ọsọ nʼụzọ nrịda Bet-Horon na-aga Azeka, Onyenwe anyị sitere nʼelu na-atụdakwasị ha ọtụtụ mkpụrụ mmiri. Ọnụọgụgụ ndị mkpụrụ mmiri ndị a dagburu dị ukwuu karịa ndị ụmụ Izrel ji mma agha ha gbuo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

11 O rue, mb͕e ha si n'iru Israel b͕alaga, mb͕e ha nọ na nrida Bet-horon, na Jehova si n'elu-igwe tudakwasi ha nkume uku rue Azeka, ha we nwua: ndi nwuru na nkume ákú-miri-ígwé ahu kariri ndi umu Israel were mma-agha b͕ue.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 10:11
17 Iomraidhean Croise  

Mgbe ahụ Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe zokwasị obodo Sọdọm na Gọmọra nkume ọkụ nke Onyenwe anyị mere ka o si nʼeluigwe zoo.


Agha ahụ gbasara nʼelu ala ahụ niile. Ndị nwụrụ nʼọhịa nʼetiti ụmụ Izrel karịrị ndị e gburu egbu.


“Ị banyela nʼụlọ niile ebe a na-achịkọba snoo, ka ị hụla ụlọ niile ebe a na-achịkọba mkpụrụ mmiri igwe,


nke m chekwara nye oge nsogbu, nʼoge ọgụ na nʼoge agha?


Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omume dịka mmiri ozuzo; oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha.


Ọ na-atụdata mkpụrụ mmiri ya dị ka mkpụrụ okwute. Onye pụrụ iguzogide oke ifufe oyi ya?


Lee, Onyenwe anyị nwere otu onye dị ike, onye nwekwara ume, dịka oke mmiri ozuzu nke akụmmiri igwe na dịka oke ifufe na-eweta mbibi, dịka oke mmiri ozuzo na-erubiga oke na dịka oke mmiri ozuzo bu idee mmiri ji ike ekwo, ọ ga-eji ike tụpụ ya nʼala.


Onyenwe anyị ga-ebili dịka o mere nʼugwu Perazim, ọ ga-akpalị onwe ya dịka o mekwara na Ndagwurugwu Gibiọn, ịrụ ọrụ ya, ọrụ ya nke dị ike nʼịkọwa, na ịrụzu ọrụ ya, ụdị nke a na-atụghị anya ya.


Onyenwe anyị ga-eme ka ndị mmadụ nụ olu ya dị ebube, ọ ga-emekwa ka ha hụ aka ya na-arịdata ala jiri ọnụma nke iwe ya na ọkụ na-erepịa erepịa, jirikwa oke mmiri ozuzo, na egbe eluigwe, na akụmmiri igwe.


Ya mere, gwa ndị ahụ jiri nzu techie mgbidi ahụ na ọ ga-ada. Oke mmiri ozuzo nke ga-ezobiga oke ga-ezo, aga m ezitekwa mkpụrụ mmiri dị ukwuu nke ga-ada, na oke ifufe nke ga-akwada ya.


Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-eso unu gaa, ọ ga-alụrụ unu ọgụ imegide ndị iro unu, ọ ga-enyekwa unu mmeri.”


Mgbe ahụ kwa, e meghere ụlọnsọ Chineke nke dị nʼeluigwe. A hụkwara igbe ọgbụgba ndụ nʼime ya. Nʼotu oge ahụ kwa, egbe eluigwe malitere ịgba, amụma gbukwara. Oke ifufe bidokwara ife. Oke ala ọma jijiji na akụmmiri igwe mere mkpọtụ nke ukwuu.


Mkpụrụ mmiri nke ịdị arọ otu nʼime ha ruru kilogram iri anọ na ọkara, sitere nʼeluigwe na-adakwasị ndị mmadụ. Nke a mekwara ka ha kọchaa Chineke nʼihi ihe ntaramahụhụ nke mkpụrụ mmiri ahụ, nʼihi na ihe ntaramahụhụ ahụ dị nnọọ njọ nke ukwuu.


Ọ bụladị kpakpando niile dị na mbara eluigwe lụrụ ọgụ megide Sisera.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan