Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 10:10 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị tinyere ha nʼọnọdụ ọgbaaghara mgbe ha zutere ndị Izrel. Nke a mere ka ndị agha Izrel lụgbuo ha na Gibiọn. Nʼezie, ọnụọgụgụ ndị ha tigburu na Gibiọn dị nnọọ ukwuu. Ma ha chụkwara ndị fọdụrụ ọsọ chụruo ha Bet-Horon, na Azeka, na Makeda, na-egbu ha nʼụzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

10 Jehova we chusa ha n'iru Israel, o tib͕ue ha oké ntib͕u na Gibeon, we chusa ha n'uzọ nrigo Bet-horon, tib͕ue ha rue Azeka, ru kwa Makeda.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 10:10
29 Iomraidhean Croise  

Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa. O jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha.


Solomọn wugharịrị obodo Gaza, wuokwa ndịda Bet-Horon,


Onyenwe anyị tigbukwara ndị Kush niile ahụ nʼihu Asa na Juda. Ndị Kush gbakwara ọsọ.


Ma ndị agha ahụ Amazaya zilagara, ka ha ghara iso ya gaa agha, wakporo ọtụtụ obodo ndị Juda site na Sameria ruo Bet-Horon. Ha gburu puku mmadụ atọ nʼime ha, bukọrọkwa ọtụtụ ihe nkwata nʼagha, buru ha laa.


Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa, o jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha.


Ọ bụghị site na mma agha ha ka ha ji merie nweta ala a, ha emerighị site nʼike nke aka ha; ọ bụ aka nri gị, aka gị, na ìhè nke ihu gị nyere ha mmeri, nʼihi na ị hụrụ ha nʼanya.


Mgbe Onye pụrụ ime ihe niile chụsasịrị ndị eze bi nʼala a, ọ dị ka snoo dara nʼelu Zalmon.


Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha, tụọ ala ha kesara ha dịka ihe nketa; o mere ka ebo niile nke Izrel biri nʼụlọ nke aka ha.


Onyenwe anyị ga-ebili dịka o mere nʼugwu Perazim, ọ ga-akpalị onwe ya dịka o mekwara na Ndagwurugwu Gibiọn, ịrụ ọrụ ya, ọrụ ya nke dị ike nʼịkọwa, na ịrụzu ọrụ ya, ụdị nke a na-atụghị anya ya.


Onyenwe anyị ga-eme ka ndị mmadụ nụ olu ya dị ebube, ọ ga-emekwa ka ha hụ aka ya na-arịdata ala jiri ọnụma nke iwe ya na ọkụ na-erepịa erepịa, jirikwa oke mmiri ozuzo, na egbe eluigwe, na akụmmiri igwe.


Nʼoge a, ndị agha eze Babilọn na-ebuso Jerusalem agha. Ha na-ebusokwa obodo ndị ọzọ nke nọgidere na-ebuso ha agha, nke bụ obodo Lakish na Azeka. Obodo ndị a bụ naanị obodo fọdụrụ nʼala Juda nke ndị agha Babilọn na-emeribeghị.


Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-apụ ibuso ndị mba ọzọ ahụ agha, dịka o si ebu agha nʼụbọchị agha.


Onyenwe anyị Chineke unu ga-enyefe ha nʼaka unu, ọ ga-etinye ha oke ọgbaaghara nʼobi, tutu ruo mgbe ha lara nʼiyi.


Mgbe ha si nʼihu Izrel gbapụ ọsọ nʼụzọ nrịda Bet-Horon na-aga Azeka, Onyenwe anyị sitere nʼelu na-atụdakwasị ha ọtụtụ mkpụrụ mmiri. Ọnụọgụgụ ndị mkpụrụ mmiri ndị a dagburu dị ukwuu karịa ndị ụmụ Izrel ji mma agha ha gbuo.


Nʼotu ụbọchị ahụ, Joshua lara obodo Makeda nʼiyi, jiri mma agha gbuo eze ya, na onye ọbụla bi nʼime ya. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nọ nʼime obodo ahụ ọ hapụrụ ndụ. Otu ihe ahụ o mere eze Jeriko ka o mere eze Makeda.


Joshua bịakwutere ha na mberede, nʼihi na ogologo abalị niile ka o si Gilgal gaa njem.


Onyenwe anyị nyefere ndị agha ha nʼaka ndị Izrel, ndị lụgburu ha, chụọ ha ọsọ ruo nʼoke ala Saịdọn, ruokwa ebe a na-akpọ Mizrefot Maim, na ruo nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼime Ndagwurugwu Mizpa. Ya mere, o nweghị ọ bụladị otu onye iro a hapụrụ ndụ nʼagha ahụ.


eze Makeda, otu eze Betel, otu


Jamut, Adulam, Soko, Azeka,


Gederọt, Bet-Dagọn, Naama na Makeda. Obodo ndị a dị iri na isii, tinyekwara obodo nta ha. Ndị Juda ketakwara:


Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ rute ala ndị Jaflet, ruo ala mgbada mgbada Bet-Horon. O si nʼebe ahụ ruo Gaza, tutu kwụsị nʼosimiri Mediterenịa.


Ndị a bụ ala nke ikwu dị iche iche dị nʼebo Ifrem nwetara. Oke ala ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ malitere nʼAtarọt-Ada. Site nʼebe ahụ, o ruru nʼakụkụ elu elu Bet-Horon;


Kibzaim na Bet-Horon, tinyere ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ.


Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jiri mma agha ya chụsaa Sisera na ndị agha ya na ụgbọ agha igwe ha nʼihu Barak. Sisera nʼonwe ya hapụrụ ụgbọ agha ya jiri ụkwụ gbapụ ọsọ.


Barak na ndị agha ya chụrụ ndị agha ahụ ọsọ, ha na ụgbọ agha igwe ha niile, chụruo ha Haroshet Hagoyim. Ha ji mma agha tigbuo ndị agha Sisera niile. Ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ.


Ọ bụladị kpakpando niile dị na mbara eluigwe lụrụ ọgụ megide Sisera.


nke ọzọ chere ihu ịga Bet-Horon, nke atọ chee ihu nʼụzọ oke ala dị na Ndagwurugwu Zeboiim, nke dị ọzara nso.


Nʼoge a, ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha ọnụ, zukọtaa nʼobodo Sokoh nke dị na Juda maka ibu agha. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼEfes Damim, nke dị nʼagbata Sokoh na Azeka.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan