Joshua 1:8 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a8 Esitela nʼọnụ gị wezuga ihe dị nʼAkwụkwọ Iwu a. Kama na-atụgharị uche gị na ya ehihie na abalị, ka i si otu a lezie anya imezu ihe niile e dere nʼime ya. Mgbe ahụ ị ga-aba ụba, ihe ga-agakwara gị nke ọma. Faic an caibideilBible Nso8 Akwukwọ iwu a agaghi-apu n'ọnu-gi, kama i gātughari uche nime ya ehihie na abali, ka i we lezie anya ime dika ihe nile si di nke edeworo nime ya: n'ihi na mb͕e ahu i gēme ka ije-gi ga nke-ọma, mb͕e ahu i gēnwe kwa uche. Faic an caibideil |
“Ma mụ onwe m, nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Mmụọ m, nke dị nʼahụ gị, na okwu m niile nke m tinyere nʼọnụ gị, agaghị apụ nʼegbugbere ọnụ gị, maọbụ nʼegbugbere ọnụ ụmụ gị, maọbụ nʼegbugbere ọnụ agbụrụ gị. Ha ga-adịgide site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi,” ka Onyenwe anyị kwuru.