Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 1:11 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 “Jegharịanụ nʼetiti ebe obibi ụmụ Izrel gwa mmadụ niile okwu sị ha ‘Dozierenụ onwe unu ihe unu ga-eri nʼụzọ, nʼihi na nʼime ụbọchị atọ, anyị ga-agafe osimiri Jọdan, imeri na inweta ala ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke na-enye unu.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

11 Gabiganu n'etiti ọmuma-ulo-ikwū, nye ndi Israel iwu, si, Doziere onwe-unu ihe unu gēri n'uzọ; n'ihi na ọ fọduru ubọchi atọ unu ewe gabiga Jọdan nka, ibà nime inweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye unu inweta ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 1:11
9 Iomraidhean Croise  

“Gaghachi azụ, gaa gwa Hezekaya, onye na-achị ndị m, ‘Otu a ka Onyenwe anyị bụ Chineke nna gị Devid, kwuru: Anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị, aga m agwọ gị. Aga m eme ka ahụ dị gị ike nʼụbọchị nke atọ site taa, mgbe ahụ ị ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.


jikerekwa nʼụbọchị nke atọ. Nʼihi na m ga-arịdata nʼelu ugwu Saịnaị nʼihu mmadụ niile.


Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie guzokwa nʼụkwụ anyị, meekwa ka anyị dịrị ndụ nʼihu ya.


Nʼihi na unu na-aga ịgafe osimiri Jọdan, ịbanye nweta ala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu. Mgbe unu nwetara ya biri nʼime ya,


Enyekwara m unu iwu nʼoge ahụ sị, “Onyenwe anyị Chineke unu enyela unu ala a ka unu nwere ya. Ma ndị unu niile, ndị bụ dimkpa, ndị jikeere maka agha, ga-agafe nọrọ ndị Izrel ndị ọzọ nʼihu.


Nụrụ, Izrel! Taa ka ị na-aga ịgafe osimiri Jọdan ịbanye ka inweta ala mba ndị dị ukwuu na ndị dị ike karịa gị, inweta obodo ndị dị ukwuu nke nwere mgbidi ha dị elu ruo nʼeluigwe.


Mgbe ahụ, Joshua nyere ndịisi Izrel niile iwu sị ha,


“Mosis, odibo m anwụọla. Ugbu a, jikere onwe gị, meekwa ka ndị m jikere ịgafe ofe ọzọ nke osimiri Jọdan, ịbanye nʼala ahụ m na-aga inye ha, bụ ndị Izrel.


Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ndịisi ụmụ Izrel gabigara jegharịa nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ahụ,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan