Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 9:9 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara sị, “M ga-aghara ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ megide mba dị otu a?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

9 M'gaghi-eleta ha n'ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ mba nke di otú a ọ́bọ̀?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 9:9
12 Iomraidhean Croise  

Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Onye dị ike nke Izrel, kwubiri sị, “Aga m abọ ọbọ megide ndị iro m, ime ka unu gharakwa inye m nsogbu ọzọ.


Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu? Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu? Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka? Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile?


Chi unu na-efe bụ nkume niile na-akwọ mụrụmụrụ, nke dị na ndagwurugwu niile, ha bụ ihe nketa nza unu fere. E, ọ bụ ha ka unu na-awụpụrụ onyinye mmanya unu niile na onyinye mkpụrụ ọka unu niile. Nʼihi ihe ndị a niile, m ga-esi aṅaa dere duu?


Ha emeela ya ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu; e, ọ ghọọla ebe kpọrọ nkụ nʼebe tọgbọrọ nʼefu nʼihu m. Ala ahụ niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu, nʼihi na o nweghị onye ọbụla ihe banyere ya na-emetụ nʼobi.


Ruo ole mgbe ka ala ga-eru ụjụ? Ruo ole mgbe ka ahịhịa dị nʼubi ga-anọgide na-akpọnwụ? Ụmụ anụmanụ na nnụnụ na-anwụchasị nʼihi na ndị bi nʼala ahụ bụ ndị na-emebi iwu. Ma ndị mmadụ ahụ na-ekwu sị, “Ọ gaghị ahụ ihe ga-adakwasị anyị.”


Elere m anya ma ahụghị mmadụ ọbụla, ụmụ nnụnụ niile dị na mbara eluigwe efefusịala.


M ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?” ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ. “M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ megide mba dị otu a?


Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị, m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọ megide mba dị otu a?”


Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ, ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ, ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe, ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ.


Gị Onyenwe anyị, ka m na-akpọku, nʼihi na ọkụ erepịala ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ. Ọkụ erechapụkwala osisi niile dị nʼọhịa.


Nụrụnụ okwu ndị a, nke a ka m na-ekwu megide unu, ọ bụ mkpu akwa maka gị ezinaụlọ nke Izrel:


“Izrel, nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, a daala, ọ gaghị ebilite ọzọ, onye a gbahapụrụ nʼala nke aka ya, ọ dịkwaghị onye ga-ekulite ya.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan