Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 9:8 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ire ha na-egbu dịka àkụ. Ọ bụ naanị okwu aghụghọ si na ya apụta. Ha ji ọnụ ha na-agwarịta ibe ha okwu udo, ma nʼime obi ha, ha na-esirịtara onwe ha ọnya igbudu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

8 Àkú nke nēb͕u eb͕u ka ire-ha bu; okwu aghughọ ka o kwuworo: n'ọnu-ya ka madu nāgwa onye-ab͕ata-obi-ya okwu udo, ma n'obi-ya ọ nēche ya anwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 9:8
21 Iomraidhean Croise  

Mgbe Abna lọghachiri na Hebrọn, Joab duuru ya gaa nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, dịka ọ chọrọ ka ha kparịtaa ụka. Ngwangwa, ọ mịpụtara nwa mma ya, jiri ya magbuo Abna, nʼihi ịbọ ọbọ ọbara nwanne ya, bụ Asahel.


O nwekwaghị onye eziokwu dị nʼọnụ ya nye onye agbataobi ya. Egbugbere ọnụ onye ọbụla na-ekwukwa okwu ire ụtọ, maọbụ aghụghọ dị nʼobi ha.


Ka Onyenwe anyị wezuga egbugbere ọnụ niile na-ekwu okwu ire ụtọ na ire niile na-ekwu okwu ịnya isi.


Gịnị ka a ga-eme gị, ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị, gị ire aghụghọ?


Adọkpụrụla m tinyere ndị ajọ mmadụ, tinyekwara ndị na-eme ajọ ihe, ndị ji ire ụtọ agwa ndị agbataobi ha okwu udo, ma ha bu iro nʼime obi ha.


Nʼihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu, kama ha na-echepụta ebubo ụgha dị iche iche megide ndị ahụ na-anọrọ onwe ha jụụ nʼime ala ahụ.


Okwu ọnụ ya dị mụrụmụrụ ka bọta, ma ibu agha juru ya obi; okwu ya niile dị nro karịa mmanụ, ma ha bụ mma agha e welitere maka ibu agha.


Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm; amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa, ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe, ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha.


O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke; olileanya m na-esite na ya na-abịa.


Ọ ga-atụgharị okwu ọnụ ha megide ha, mee ka ha laa nʼiyi; ndị niile hụrụ ha ga-efufe isi ha nʼịkwa emo.


Onye na-agbagịde onye agbataobi ya ama ụgha, dịka mkpọrọ osisi maọbụ mma agha, maọbụ àkụ a pịziri apịzi.


“E nwere ndị ajọ mmadụ nʼetiti ndị m, ndị na-edo onwe ha dịka ndị mmadụ na-esiri nnụnụ ọnya, dịka ndị na-esi ọnya ka ha nwude mmadụ.


Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị, m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọ megide mba dị otu a?”


“Ha na-ekwe ire ha dịka ụta, ịgbapụ okwu ụgha dịka àkụ; Ọ bụghị site nʼeziokwu ka ihe ji agara ha nke ọma nʼala ahụ. Ha na-esite nʼotu mmehie gaa nʼọzọ; ọ dịkwaghị mgbe ha ji mara m,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.


“Lezie anya, gbaara enyi gị ọsọ. Atụkwasịkwala nwanne gị obi. Nʼihi na nwanne ọbụla na-aghọ aghụghọ. Ndị enyi niile bụkwa ndị nkwutọ.


Enyi na-aghọgbu enyi ya, ọ dịkwaghị onye na-agwa ibe ya eziokwu. Ha azụọla ire ha ikwu naanị okwu ụgha; ha emeekwala ka ike gwụ anụ ahụ ha ime mmehie.


Ndị ọgaranya unu bụ ndị na-eme ihe ike, ndị mmadụ nọ nʼime gị na-agha ụgha, ire ha na-ekwu naanị okwu aghụghọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan