Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 9:7 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, aga m anụcha ha, nwaa ha ọnwụnwa. Gịnị ọzọ ka m kwesiri ime nʼihi mmehie ndị m?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

7 N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji kwue otú a, si, Le, M'gaje inucha ha, we nwaputa ha; n'ihi na M'gēsi aṅa me n'ihi ada ndim?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 9:7
22 Iomraidhean Croise  

Mgbe ahụ, Absalọm rịọrọ nna ya sị, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na ị gaghị abịa, ị ga-emekwa ka nwanna m nwoke Amnọn, na ụmụ eze ndị ọzọ bịa?” Eze jụrụ ya sị, “Nʼihi gịnị ka Amnọn ga-eji soro gị gaa?”


Onyenwe anyị, Chineke nna nna ha, sitere nʼọnụ ndị amụma ya gwa ha okwu mgbe na mgbe, ịdọ ha aka na ntị. O mere nke a nʼihi na o nwere obi ebere nʼebe ha nọ, na nʼebe ụlọnsọ ukwu ya dị.


Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ, ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere.


Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile, ọ ga-agba gị ume; ọ gaghị ekwe ka ewezuga onye ezi omume.


O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke; olileanya m na-esite na ya na-abịa.


Aka m ga-abịakwasị unu. Aga m anụcha unu dịka e si anụcha ọlaedo, si otu a wepụchaa unyi niile dị nʼime unu.


Lee, anụchaalam unu, ma ọ bụghị dịka e si anụcha ọlaọcha nʼọkụ. E, anwaleela m unu nʼoke ọkụ nke ahụhụ.


Nʼihi na aka unu jupụtara na ntụpọ ọbara, mkpịsịaka unu bụkwa nke mmehie merụrụ. Egbugbere ọnụ unu ekwuola okwu ụgha, ire unu na-atamukwa ihe ọjọọ.


Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke, onye ihe ya na-atọ m ụtọ? Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya, ma anọkwa m na-echeta ya. Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike. Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.


“Jegharịa nʼokporoụzọ niile dị na Jerusalem, legharịa anya, ma mara, chọkwanụ gburugburu nʼama ya niile. Ma unu ọ ga-achọpụta otu onye, bụ onye na-eme ihe ziri ezi, na onye na-achọ eziokwu. M ga-agbagharakwa obodo a


“Emeela m gị ka ị bụrụ onye na-anwapụta ọla, ma ọla ahụ bụkwa ndị m. Achọrọ m ka i nyochaa ma nwapụtakwa ụzọ ha niile.


Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Izrel, nʼihi na Onyenwe anyị nwere ebubo megide unu ndị bi nʼala a. “Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya, ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile.


Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ a fọdụrụ ka m ga-ewebata nʼime ọkụ. Aga m eji ọkụ nụchaa ha dịka e si anụcha ọlaọcha, jiri ọkụ nwaa ha dịka e si anwa ọlaedo. Ha ga-akpọku aha m, aga m azakwa ha. Aga m asịkwa, ‘Ndị a bụ ndị m,’ Ha onwe ha ga-asịkwa, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke anyị.’ ”


Ọ na-anọdụ ala dịka ndị na-anụcha ọlaọcha ime ka ọ dị ọcha. Ọ ga-anụcha ndị Livayị, ime ka ha dị ọcha, dịka ọlaedo na ọlaọcha a nụchara anụcha tutu ruo mgbe ha ga-ewetara Onyenwe anyị onyinye nʼezi omume.


Ọnwụnwa ndị a na-abịa ime ka okwukwe unu, nke dị oke ọnụahịa karịa ọlaedo na-ala nʼiyi nʼagbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya; bụrụ nke ga-eweta otuto, na ebube, na nsọpụrụ, mgbe e mere ka Jisọs Kraịst pụta ìhè.


Ụmụnna m, ka ọ hapụ iju unu anya mgbe ọnwụnwa dị iche iche na-abịara unu nʼihi na ihe dị otu a abụghị ihe ọhụrụ nʼebe unu nọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan