Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 9:12 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Olee onye ahụ maara ihe, nke nwere ike ịghọta ihe ndị a niile? Onye ka Onyenwe anyị ziri ihe ndị a, nke ga-akọwa ya? Gịnị mere e ji bibie ala a, kposaa ya, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka ọzara mmadụ na-enweghị ike ịgafe?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

12 Ònye bu onye mara ihe, ka o we ghọta nka ònye bu kwa onye ahu ọnu Jehova gwaworo okwu, ka o we gosi ya? n'ìhi gini ka ala nka laworo n'iyì, esure kwa ya ọku dika ọzara, onye-ngabiga we ghara idi?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 9:12
22 Iomraidhean Croise  

Ọ na-eme ka ala na-amị mkpụrụ hiri nne ghọọ ọzara, nʼihi ajọ omume nke ndị bi nʼime ya.


Onye ọbụla maara ihe ga-echezi echiche banyere ihe ndị a, ma tuleekwa ọrụ ịhụnanya Onyenwe anyị nke dị ukwuu.


Onye ka ọ bụ nʼetiti unu nke ga-ege ntị nʼihe ndị a? Onye ga-aṅa ntị si otu a mata ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu?


Ndị jupụtara nʼala a bụ ndị na-akwa iko. Nʼihi ịbụ ọnụ ndị a niile ala a tọgbọrọ nʼefu, ahịhịa niile dị nʼọzara akpọnwụọla. Ndị amụma na-agbasokwa ihe ọjọọ. Ha na-egosikwa ike ha nʼụzọ na-ezighị ezi.


Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Unu aṅala ntị nʼihe ndị amụma ahụ na-eburu unu nʼamụma, nʼihi na olileanya ha na-ewetara unu abụghị ezi olileanya. Ọhụ ha na-agwa unu na ha hụrụ bụ ihe ha chepụtara nʼobi ha, o sighị nʼọnụ Onyenwe anyị rute ha


A sị na ha abịala nso guzo nʼebe ịgba izu nzuzo m, ha gaara ekwusara ndị m okwu m, nke gaara eme ka ha site nʼajọ omume ha tụgharịa, sitekwa nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.


Ka onye amụma ahụ rọrọ nrọ kọgharịa nro ọ rọrọ. Otu a kwa, ka onye ahụ okwu m dị nʼọnụ ya nọgidekwa na-ekwusa ya nʼeziokwu. Nʼihi na gịnị ka okporo ọka na mkpụrụ ọka nwekọrọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.


Ugbu a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ụmụ nwanyị, megheenụ ntị unu nụrụ okwu si ya nʼọnụ. Kuzierenụ ụmụ unu ndị inyom otu e si eti mkpu akwa, kuziekwaranụ ibe unu abụ akwa.


A ga-akasịkwa unu obi mgbe unu hụrụ omume ha na obibi ndụ ha, unu ga-amatakwa na ọ bụghị nʼefu ka m mere ka ihe ndị a niile dakwasị ha.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.


Onye bụ onye amamihe? Ha ga-aghọta ihe ndị a. Onye bụ onye nwere uche nghọta? Ha ga-aghọta ihe ọ pụtara. Nʼihi na ụzọ Onyenwe anyị bụ ezi ụzọ. Ndị ezi omume na-ejekwa ije na ha, ma ndị na-enupu isi na-asọ ngọngọ nʼime ha.


“Ha ga na-eri ihe ma afọ agaghị eju ha. Ha ga-ebi ndụ akwụna ma ha agaghị amụba, nʼihi na ha ajụla Onyenwe anyị, were onwe ha nyefee


Daanụ mba nʼobi unu, unu ndị ọrụ ubi, tienụ mkpu akwa, unu ndị ọrụ ubi vaịnị. Tienụ aka nʼobi nʼihi ọka wiiti na ọka balị, nʼihi na a laala owuwe ihe ubi nʼiyi.


“Egbuchapụla m mba niile dị iche iche, kwatukwaa ebe ha niile e wusiri ike. Ahapụla m okporoụzọ ha ka ọ bụrụ ihe a gbahapụrụ agbahapụ, ọ dịkwaghị onye na-esi na ha agabiga. A laala obodo ha niile nʼiyi, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ, ọ bụladị otu onye.


“Ya mere, mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi, nke e kwuru okwu ya site nʼọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo nʼebe nsọ (onye na-agụ ya nwee nghọta ihe ọ pụtara).


A sịkwarị na ha maara ihe, nwee uche nakwa ịghọta ihe ikpeazụ ha ga-abụ.


Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-agụpụta okwu ndị a dị nʼamụma a. Ngọzị na-adịkwara ndị na-anụ ya, ma nabata ihe e dere nʼime ya nʼobi ha. Nʼihi na oge mmezu ha dị nso.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan