Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 8:8 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 “ ‘Unu si aṅaa kwuo, “Ndị maara ihe ka anyị bụ, nʼihi na iwu Onyenwe anyị dị nʼaka anyị,” ebe ọ bụ na mkpisi akwụkwọ aghụghọ ndị ode akwụkwọ unu adịghị akọwa iwu ya otu o kwesiri?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

8 Ùnu si aṅa si, Ndi mara ihe ka ayi bu, iwu Jehova di kwa n'aka ayi? Ma otú o di, le, okwu-ugha ka pen ugha nke ndi-ode-akwukwọ meworo ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 8:8
18 Iomraidhean Croise  

Onye nzuzu ga-aghọ onye maara ihe naanị mgbe nwa ịnyịnya ibu ọhịa mụrụ ghọrọ mmadụ.


Ọ na-emechi ọnụ ndị ndụmọdụ a tụkwasịrị obi, wepụkwa nghọta nke ndị okenye.


O kpugheela okwu ya nye Jekọb, iwu ya na ụkpụrụ ya niile nye Izrel.


Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye. Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha.


Site na mmalite, nna nna unu ha mehiere megide m. Ndị m dunyere ka ha kuziere unu ihe nupukwara isi megide m.


Ha sịrị, “Bịanụ ka anyị gbaa izu megide Jeremaya, nʼihi na izi iwu agaghị esite nʼebe ndị nchụaja nọ kwụsị, maọbụ ndụmọdụ nʼebe ndị maara ihe, ma ọ bụkwanụ okwu site nʼebe ndị amụma nọ. Ya mere, bịanụ ka anyị were ire anyị buso ya agha, gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ọbụla nke ọ na-ekwu.”


“ ‘Nʼebe a ka m ga-anọ laa nzube niile nke Juda na Jerusalem nʼiyi. Aga m eme ka ha daa site na mma agha nʼihu ndị iro ha, nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike. Aga m enye ụmụ anụ ufe na anụ ọhịa ozu ha dịka nri.


Ndị nchụaja ajụghị sị, ‘Olee ebe Onyenwe anyị nọ?’ Ndị ikpe ha amaghị m, ndị na-achị ha mehiere megide m, ndị amụma ha bụkwa aha Baal ka ha ji ebu amụma, ha gbasooro ihe na-enweghị isi.


“Ndị m bụ ndị nzuzu, ha amaghị m. Ha bụ ụmụntakịrị ndị na-enweghị uche, ha enweghị nghọta ọbụla. Ha bụ ọkachamara nʼihe gbasara ajọ omume, ma ha amaghị otu esi eme ezi ihe ọbụla.”


“Unu si aṅaa ekwu sị, ‘Ndị dị ike nʼagha ka anyị bụ; anyị bụkwa dimkpa nʼagha’?


E depụtaara m ha ọtụtụ ihe banyere iwu m, ma ha were ya dịka ihe e si na mba ọzọ webata.


Nʼihi ya, ha agaghị eji ya asọpụrụ nna ha maọbụ nne ha. Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme ka okwu Chineke bụrụ ihe efu nʼihi omenaala unu.


Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu kpuru ìsì, ikpe ọmụma mmehie agaghị ama unu, ma ugbu a ebe unu sị na unu na-ahụ ụzọ ikpe ọmụma unu na-adịgide.”


Mgbe ha na-eche na ha bụ ndị maara ihe, ha amataghị na ha bụ ndị nzuzu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan