Jeremaya 8:5 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a5 Gịnịkwa mere ndị a ji tụgharịa site nʼịgbaso ụzọ ọjọọ ha? Gịnị mere Jerusalem ji nọgide na-agbaso ụzọ ọjọọ? Lee, ha na-ejidesi aghụghọ aka ike; ha jụrụ ịtụgharị. Faic an caibideilBible Nso5 Gini mere ndi nka nke Jerusalem ji adaghachi azu na ndaghachi-azu ebighi-ebi? ha ejidesiwo aghughọ ike, ha ajuwo ilọta. Faic an caibideil |
Ya mere, aga m eme ka ọdụm si nʼoke ọhịa bịa lụso ha ọgụ; nkịta ọhịa bi nʼọzara ga-ebibi ha. Otu a kwa, agụ ga-abịa makpuru nso nso obodo ha ịdọkasị onye ọbụla si nʼime obodo ahụ na-apụta. Ihe ndị a ga-emezu nʼihi na nnupu isi ha adịla ukwuu, na nʼihi na ndaghachi azụ ha site na iso ụzọ m adịla ukwuu.