Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 8:21 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ebe ọ bụ na a zọpịara ndị m, ọ bụkwa m ka azọpịara. Anam eru ụjụ, oke egwu jisikwara m aka ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

21 N'ihi nb͕aji ukwu na aka nke ada ndim ka ab͕ajiworom ukwu na aka: anameyi uwe-nkpe; iju-anya ejidesiwo m ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 8:21
14 Iomraidhean Croise  

Azara m eze sị, “Onyenwe m, ka ọchịchị eze dị ogologo ndụ. Gịnị ga-eme ka obi dị m ụtọ ebe ọ bụ na obodo ahụ e liri nna nna m ha aghọọla mkpọmkpọ ebe, nke a kpọkwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ?”


“Gwa ha okwu ndị a, “ ‘Ka anya mmiri si nʼanya m na-eruda ehihie na abalị, na-akwụsịghị akwụsị, nʼihi ndị m, nʼihi ada ndị m, nke na-amaghị nwoke, ndị hụrụla ahụhụ dị ukwuu, ndị e tipụtara ọnya jọrọ njọ.


“Juda na-eru ụjụ, ndị bi nʼobodo ya niile na-ahụjukwa anya. Ha na-akwa akwa nʼihi ala ahụ, ụda ịkwa akwa ha eruokwala Jerusalem.


Ma esitebeghị m na ị bụ onye ọzụzụ atụrụ gị wezuga onwe m. Ị maara na ọ bụghị ọchịchọ obi m ịhụ ụbọchị ahụ na-eweta ịda mba. Ị maara ụdị okwu niile na-esite nʼọnụ m na-apụ.


Ihe mgbu a dị ukwuu. Lee na apụghị m ịnagide ya. Obi m o, obi m o! Lee ka obi m si ada m gbim gbim gbim. Apụghịkwa m ịnọ jụụ. Ana m anụ ụda opi ike, na-anụkwa ụzụ agha.


“Oge owuwe ihe ubi agafeela, leekwa na ọkọchị agabigakwala, ma a zọpụtabeghị anyị.”


Ọ gaara adị m mma ma a sị na isi m bụ isi iyi, ebe mmiri si asọpụta; ọ gaara adị m mma ma a sịkwa na anya mmiri akwa jupụtara m nʼanya. Agaara m akwagide akwa ehihie na abalị nʼihi ndị m niile e gburu egbu.


Abụ m onye hụrụla ahụhụ site na mkpara igwe nke nrubiga oke nke iwe Onyenwe anyị.


Egwu na-ejide ndị niile ha chere ihu. Ihu ha na-agbarụkwa.


E bibiela ya. A gbahapụla ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Obi ndị nọ nʼime ya na-alọ mmiri, ikpere ha niile na-ama jijiji, anụ ahụ ha niile na-amakwa jijiji, ihu niile achagharịakwala.


Mgbe ọ rutere Jerusalem nso, ebe ọ nọ hụzie obodo ahụ anya nke ọma. Ọ bere akwa nʼihi ya,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan