Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 8:18 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na m hụrụ onye ga-akasị m obi nʼime ọnọdụ iru ụjụ m, nʼihi na obi m na-ada mba nʼime m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

18 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na agamab͕asa irum megide unu taa! n'arum ka aru nādighi obim ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 8:18
12 Iomraidhean Croise  

O Onyenwe anyị, zaa m ọsịịsọ; mmụọ m na-ada mba. Ezonarịla m ihu gị, ma ọ bụghị ya, aga m adị ka ndị na-arịda ruo nʼili.


Nʼihi nke a, asịrị m, “Lepụnụ m anya ka m nọọrọ onwe m; ka m bee akwa dị ilu. Unu anwakwala ịkasị m obi, nʼihi mbibi e bibiri ndị m.”


Ma banyere ndị amụma, obi m na-agbawa nʼime m, ọkpụkpụ m na-amakwa jijiji nʼihi ha. Adị m dịka nwoke mmanya na-egbu, dịka onye ṅụbigara mmanya oke, nʼihi ihe na-eche ha site nʼaka Onyenwe anyị, na site nʼokwu nsọ ya.


Ihe mgbu a dị ukwuu. Lee na apụghị m ịnagide ya. Obi m o, obi m o! Lee ka obi m si ada m gbim gbim gbim. Apụghịkwa m ịnọ jụụ. Ana m anụ ụda opi ike, na-anụkwa ụzụ agha.


Anyị anụla akụkọ banyere ude ha, ike agwụla aka anyị abụọ kpamkpam. Oke ihe mgbu na-ejide anyị dị ka nke nwanyị ime na-eme.


Ọ gaara adị m mma ma a sị na isi m bụ isi iyi, ebe mmiri si asọpụta; ọ gaara adị m mma ma a sịkwa na anya mmiri akwa jupụtara m nʼanya. Agaara m akwagide akwa ehihie na abalị nʼihi ndị m niile e gburu egbu.


Nʼihi nke a, obi anyị na-ada mba, nʼihi ihe ndị a ka anya anyị na-agba ọchịchịrị.


Amara m jijiji nʼobi m mgbe m nụrụ ihe ndị a niile, egbugbere ọnụ m abụọ kụkọtara nʼegwu, ọkpụkpụ dị m nʼahụ malitere ire ure, mee ka ụkwụ m maa jijiji. Ma aga m eji ndidi chere ụbọchị ọjọọ ahụ nke ga-abịakwasị ndị ahụ na-abịa ibuso anyị agha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan