Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 8:16 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 E sitere na Dan nụ ụda ịma imi ịnyịnya ndị iro. Ala a niile mara jijiji mgbe ha nụrụ akwa nke ịnyịnya ndị ahụ dị ike. Ha na-abịa ịla ala a na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha na-abịa ime obodo a na ndị bi nʼime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

16 Site na Dan ka anuru ima-imi nke inyinya-ya nile: site n'olu ọbube nile nke inyinya-ya nile di ike ala nka nile amawo jijiji; ha we bia richapu ala na ùjú-ya; obodo na ndi bi nime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 8:16
22 Iomraidhean Croise  

Ị na-eme ya ka ọ wụgharịa dịka igurube, were ebube nke ịmapụ imi ya na-eyinye ihe oke egwu?


Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị; ụwa na ndị niile bi nʼime ya.


Wụkwasị ọnụma gị nʼelu mba niile dị iche iche bụ ndị na-amaghị gị, wụkwasịkwa ya ndị ahụ niile na-adịghị akpọku aha gị. Nʼihi na ha eripịala Jekọb, ha eripịala ya kpamkpam, bibiekwa ebe obibi ya.


Ma site mgbe anyị dị na nwantakịrị, ihe ihere ahụ eripịala mkpụrụ sitere na ndọgbu nʼọrụ nke nna nna anyị ha igwe anụ ụlọ na ehi ha, ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom.


“ ‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị; ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ. Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike. Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha.


“Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘A na-anụ mkpu akwa sitere nʼegwu, nke oke egwu, ọ bụghị udo.


Elere m anya nʼugwu ukwu, hụ na ha na-ama jijiji, leekwa anya nʼugwu nta, hụ na ha na-aṅagharị aṅagharị.


Dịka ọdụm si nʼebe o zoro onwe ya amapụta, ka onye a na-ebibi mba niile si abịa. Ọ hapụla ebe obibi ya, na-abịa ịla Juda nʼiyi. Ọ ga-etidasị obodo niile nke Juda, ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ha.


Mgbe ha ga-anụ ụzụ ikiri ụkwụ nke ọtụtụ ịnyịnya, nke na-agbata ọsọ na-abịa nʼebe ha nọ, mgbe ha ga-anụkwa ụzụ ụgbọ agha ndị iro, na ụzụ nzọ ụkwụ igwe ha. Nʼoge ahụ, ndị bụ nna agaghị enwe ike nyere ụmụ ha aka, nʼihi na aka ha ga-akụda nʼakụkụ ha.


Ha ga-eripịa ihe niile unu wetara nʼubi, ya na nri niile unu nwere. Ha ga-ebibi ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị. Ha ga-ebibi igwe ewu na atụrụ unu, na igwe ehi unu. Ha ga-ebibikwa osisi vaịnị na osisi fiig unu. Ọ bụ mma agha ha ka ha ga-eji bibie obodo unu niile e wusiri ike, bụ obodo ndị ahụ niile unu na-atụkwasị uche.


Ha ji ọtụtụ ụta na ùbe; ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-enweghị obi ebere. Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri, dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha. Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha, ibuso gị agha, Ada Babilọn.


Ala ahụ na-ama jijiji, na-atakwa ikikere eze nke ihe mgbu, nʼihi na nzube Onyenwe anyị zubere megide Babilọn ga-emezu. Ọ ga-eme ka ala Babilọn ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya.


Ha ji ụta na ùbe, ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-adịghị eme obi ebere. Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri, dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha. Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha, ibuso gị agha, Ada Zayọn.”


Ụda ụtarị, ụda ụkwụ ụgbọ ịnyịnya, ikiri ụkwụ ịnyịnya na-agba ọsọ, na mkpọtụ nke ụgbọ ịnyịnya agha!


Mgbe ugwu niile hụrụ gị ha nyagharịrị onwe ha nʼihi ihe mgbu bịakwasịrị ha. Oke mmiri ozuzo gabigakwara. Ogbu mmiri mere ka olu ya daa ụda, buliekwa ebili mmiri elu.


Nʼihi na, “Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị.”


Ma ọ buru na e nwee onye gwara gị, “A chụrụ ihe a nʼaja.” Unu erila nri ahụ, maka onye ahụ mere ka unu mata, na nʼihi akọnuche.


Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ aha obodo ahụ Dan, nke bụ aha nna ha ochie, onye bụ nwa Izrel. Ma tupu ebo Dan ebibie ya, aha obodo a nʼoge gara aga bụ Laish.


Mgbe ahụ, ndị Izrel niile ndị si nʼala Dan ruo Bịasheba, tinyere ndị si nʼala Gilead, pụtara dịka otu mmadụ, bịa zukọọ nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa.


Gee ntị nụrụ ụda nzọ ụkwụ nke ịnyịnya ndị iro. Leekwa mwuli elu nke ụkwụ ịnyịnya ahụ!


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan