Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 8:14 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Gịnị ka unu na-eme nʼebe a unu nọdụrụ ala? Kwakọtaanụ ihe unu niile. Ngwa, ka anyị gbapụnụ ọsọ gaa nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike nọdụ nʼebe ahụ nwụọ! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke anyị amaala anyị ikpe ọnwụ. O nyela anyị mmiri e tinyere nsi ka anyị ṅụọ, nʼihi na anyị emehiela megide ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

14 N'ìhi gini ka ayi onwe-ayi nānọdu ala? chikọtanu onwe-unu, ka ayi ba n'obodo nile ewusiri ike, we debe ọnu-ayi du n'ebe ahu: n'ihi na Jehova, bù Chineke-ayi, emewo ka ayi debe ọnu-ayi du, O mewo kwa ka ayi ṅua miri ńsí, n'ihi na ayi emehiewo megide Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 8:14
23 Iomraidhean Croise  

Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ndị amụma a, “Aga m eme ka ha rie nri na-akụ ilu, meekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere nsi, nʼihi na mmụọ nke amaghị Chineke esitela nʼaka ndị amụma nọ na Jerusalem gbasaa ruo ndị niile bi nʼala ahụ.”


Nʼihi ya, nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel kwuru, “Lee, aga m eme ka ndị a rie nri na-akụ ilu. Ha ga-aṅụkwa mmiri e tinyere nsi.


Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m, ya na ihe ilu na oluilu.


Ma mgbe Nebukadneza eze Babilọn busoro ala anyị agha, anyị kpebiri sị, ‘Bịanụ ka anyị gbaba Jerusalem si otu a gbanarị ndị agha Babilọn, na ndị agha ndị Aram.’ Ọ bụ nke a mere anyị ji biri na Jerusalem.”


Ha nyere ya mmanya a gwara ọgwụ ilu ka ọ ṅụọ. Mgbe o detụrụ ya ire, o kweghị ya ọṅụṅụ.


Ha tinyere oluilu nʼime nri m, nyekwa m mmanya gbara ụka ka m ṅụọ.


Devid sịrị Abishai, “Lee nwoke a bụ Sheba nwa Bikri na-aga ime ihe ọjọọ ga-adị njọ karịa nke Absalọm mere. Chịrị ndị agha nna gị ukwu chụso ya, ma ọ bụghị ya, ọ ga-achọta obodo e wusiri ike gbaba, ebe anyị na-apụghị inweta ya.”


Lezienụ anya ka unu hụ na obi onye ọbụla nʼime unu, nwoke maọbụ nwanyị, agbụrụ maọbụ ebo ọbụla nʼIzrel, esighị nʼebe Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nọ pụọ, bido chewe echiche ife chi ndị mba ọzọ ndị a niile. Lezienụ anya hụ na mgbọrọgwụ na-ewepụta nsi na-elu ilu dị otu a adịghị nʼetiti unu.


Derenụ duu nʼihu Onyenwe anyị, unu mmadụ niile, nʼihi na o sitela nʼebe obibi ya dị nsọ kpalie onwe ya.”


Ma Onyenwe anyị nọ nʼime ụlọnsọ ukwu ya. Ya mere, ka ụwa niile dere duu nʼihu ya.


Ma ọ bụrụ na nwanna, bụ onye nke na-aga ịkpọ anụ ahụ ndị a ọkụ, abata ibupụ ha nʼezi, ọ jụọ otu onye nọ nʼime ime ụlọ ahụ sị, “O nwere onye ọzọ gị na ya nọ?” Onye ahụ zaa, “Ọ dịghị,” mgbe ahụ nwanna ahụ ga-asị, “Nọọ jụụ. Anyị agaghị akpọ aha Onyenwe anyị.”


Onyenwe anyị, anyị nabatara ajọ omume anyị, na ikpe mara nna nna anyị ha; nʼezie, anyị onwe anyị emehiekwala megide gị.


Ma mgbe m mechiri ọnụ m ma nọrọ duu, jụ ikwu ọ bụladị ihe ọbụla dị mma, oke ihe mgbu m mụbara.


Osisi vaịnị ha si nʼosisi vaịnị Sọdọm, na nʼubi dị na Gọmọra mkpụrụ vaịnị ha jupụtara na nsi, ụyọkọ vaịnị ha jupụtara nʼilu ilu.


Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị bu nʼobi mgbe o kwuru sị, “ ‘Nʼetiti ndị niile na-abịaru m nso ka a ga-edo m nsọ ọ bụkwa nʼihu ọha mmadụ, ka a ga-asọpụrụ m.’ ” Ma Erọn gbara nkịtị.


“Nọdụ duu, baa nʼime ọchịchịrị, gị eze obodo nke ndị Kaldịa; Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ a ga-akpọ gị nwanyị nwe alaeze dị iche iche.


Ka anyị dinara ala nʼihere anyị, ka ọnọdụ oke ihere dịrị anyị kpuchikwa anyị. Anyị na nna nna anyị ha emehiela megide Onyenwe anyị Chineke anyị; site mgbe anyị dị na nwantakịrị ruo taa o nwebeghị mgbe anyị ji rube isi ime ihe Onyenwe anyị Chineke anyị nyere nʼiwu.”


Ọ bụ ezie na mmehie anyị na-agbagide anyị ama, Onyenwe anyị, biko rụọ ọrụ gị nʼihi aha gị. Anyị emehiela megide gị. Ndaghachi azụ anyị site nʼebe ị nọ dịkwa ukwuu.


Kama, ha na-agbaso isiike nke obi ha, ha gbasoro chi Baal dịka nna nna ha si kuziere ha.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan