Jeremaya 8:10 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a10 Ya mere, aga m akpọnye ndị ikom ọzọ nwunye ha, werekwa ubi ha nyefee nʼaka ndị ọrụ ubi ọzọ. Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta, ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha. Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ. Faic an caibideilBible Nso10 N'ihi nka ka M'gāchiri nwunye-ha nye ndi ọzọ, were kwa ubi nile ha nye ndi gēnweta ha: n'ihi na site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku onye ọ bula bu onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku, site n'onye-amuma we rue onye-nchu-àjà onye ọ bula nēme ihe n'ugha. Faic an caibideil |
Ndị a kwa na-adagharị site na mmanya sitekwa nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya. Ndị nchụaja na ndị amụma na-adagharị site na ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya, mmanya emeela na ha amakwaghị ihe ha na-eme; ha na-adagharị site nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya ha na-adagharị mgbe ha na-ahụ ọhụ dị iche iche, ha na-asọ ngọngọ mgbe ha nʼekpe ikpe.