Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 7:7 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 mgbe ahụ, aga m ekwere ka unu biri nʼebe a, nʼala a m nyere nna nna unu ha, ruo mgbe ebighị ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

7 M'gēme kwa ka unu biri n'ebe a, n'ala nka nke M'nyere nna-unu-hà, site na mb͕e ebighi-egi gara aga we rue mb͕e ebighi-ebi di n'iru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 7:7
12 Iomraidhean Croise  

Ma agaghị emekwa ka ụkwụ ndị Izrel hapụ ala ahụ nke m kenyere nna nna unu, naanị ma ọ bụrụ na ha elezie anya debe ihe niile m nyere ha nʼiwu banyere iwu niile, ụkpụrụ niile na ntụziaka niile m nyere site nʼaka Mosis.”


“Unu emegbula nwanyị ọbụla di ya nwụrụ, maọbụ onye ọbụla na-enweghị nne na nna.


Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi, aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a.


Ozi ha ziri unu bụ nke a, “Unu niile nʼotu nʼotu sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ndụ ọjọọ unu tụgharịa, ka unu nwee ike ibigide nʼala a Onyenwe anyị nyere unu na nna nna unu ha ruo mgbe ebighị ebi.


Ma ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu zie ezi, ọ bụrụ na unu erube isi nye Onyenwe anyị Chineke unu, mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ o zubere na ọ ga-abịakwasị unu ghara ịbịakwasị unu.


Nʼụbọchị ahụ ndị Juda ga-adịnyere ndị Izrel, ha abụọ ga-ejikọta aka site nʼala ahụ dị nʼugwu bịa nʼala nke m nyere nna nna unu dịka ihe nketa.”


Mgbe mgbe ka m ziteere unu ụmụ ohu m bụ ndị amụma, ndị bịara gwa unu okwu sị, “Dozienụ ụzọ unu, sitekwanụ nʼajọ omume unu tụgharịa. Unu niile nʼotu nʼotu, unu agbasola chi ndị ọzọ ife ha. Ọ bụrụ na unu emee otu a, unu ga-ebi nʼala a m nyere unu na nna nna unu ha.” Ma unu jụrụ ịṅa ntị, jụkwa ige m ntị.


“Ọ bụrụ na unu bụ Izrel, ga-alọta, ka Onyenwe anyị kwubiri, mụ ka ị ga-alọghachikwute,” “Ọ bụrụ na unu ewezuga arụsị ndị ahụ rụrụ arụ site nʼihu m, hapụ isi ebe m nọ kpafuo,


Asịrị m, banyere Jerusalem, ‘Nʼezie, ị ga-atụ egwu m, ma nabatakwa ntụziaka.’ Mgbe ahụ, agaghị ebibi ebe mgbaba ya, ma ọ bụkwanụ ntaramahụhụ m niile agaghị abịakwasịkwa ya. Ma otu ọ dị, ọ nụrụ ha ọkụ nʼobi ịga nʼihu mee omume rụrụ arụ nʼihe niile bụ nke ha mere.


Debenụ ụkpụrụ ya na iwu ndị a niile m na-enye unu taa, ka ihe niile gaara unu na ụmụ unu nke ọma, ka unu biekwa nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye unu ruo mgbe niile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan