Jeremaya 7:6 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a6 ọ bụrụ na unu ahapụ imegbu ndị ọbịa, na ndị na-enweghị nna, maọbụ nwanyị di ya nwụrụ; ọ bụrụ na unu ajụ iwufu ọbara onye aka ya dị ọcha nʼebe a, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaso chi ndị ọzọ nke na-ewetara unu nsogbu, Faic an caibideilBible Nso6 ọ buru na unu adighi-emeb͕u ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwanyi di-ya nwuru, ọ buru kwa na unu adighi-awusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ebe a, ọ buru kwa na unu adighi-ejeso chi ọzọ di iche iche ime onwe-unu ihe ọjọ: Faic an caibideil |
Mgbe mgbe ka m ziteere unu ụmụ ohu m bụ ndị amụma, ndị bịara gwa unu okwu sị, “Dozienụ ụzọ unu, sitekwanụ nʼajọ omume unu tụgharịa. Unu niile nʼotu nʼotu, unu agbasola chi ndị ọzọ ife ha. Ọ bụrụ na unu emee otu a, unu ga-ebi nʼala a m nyere unu na nna nna unu ha.” Ma unu jụrụ ịṅa ntị, jụkwa ige m ntị.
“Mgbe ahụ, aga m abịa unu nso ikpe unu ikpe. Aga m abịakwa ngwangwa ịgbagide ha ama bụ ndị mgbaasị, na ndị na-akwa iko, na ndị na-aṅụ iyi ụgha, na ndị na-emegbu ndị inyom di ha nwụrụ, na ndị na-emegbu ndị na-enweghị nna, na ndị na-anapụ ndị ọbịa ikpe ziri ezi, ndị ahụ niile na-adịghị atụ egwu m.” Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.