Jeremaya 7:5 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a5 Ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu guzozie, ọ bụrụ na unu emesoo ibe unu mmeso nʼụzọ ikpe ziri ezi, Faic an caibideilBible Nso5 N'ihi na ọ buru na unu eme ka uzọ nile unu na omume nile unu dizue nma; ọ buru na unu emezue ihe ekpere n'ikpe n'etiti otù onye na ibe-ya; Faic an caibideil |
Unu ụlọ Devid, otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi kwa ụtụtụ niile; napụtanụ ndị a na-emegbu emegbu site nʼaka ndị na-emegbu ha. Napụtakwanụ ndị a na-apụnara ihe ha nwere site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ndị a. Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu, dịka ọkụ nʼihi ajọ omume unu, ọ dịkwaghị onye pụrụ ime ka ọ kwụsị.
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Meenụ ihe dị mma na ihe ziri ezi. Napụtanụ onye eji aka ike napụ ihe o nwere site nʼaka onye ahụ na-emegbu ya. Unu emejọkwala onye ọbịa, maọbụ mee ya ihe ike. Unu emekwala ndị na-enweghị nna, maọbụ ndị inyom di ha nwụrụ ihe ọjọọ. Unu awụsịkwala ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼebe a.