Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 7:21 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 “ ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Gaanụ nʼihu, tụkwasịnụ aja nsure ọkụ unu nʼelu aja unu ndị ọzọ niile. Riekwanụ anụ ndị a nʼonwe unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

21 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Tukwasinu àjà-nsure-ọku nile unu n'elu àjà nile unu, ri-kwa-nu anu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 7:21
9 Iomraidhean Croise  

Anaghị m abara unu mba nʼihi ịchụ aja unu, na aja nsure ọkụ unu nke na-adị m nʼihu oge niile.


I kpụrụghị atụrụ wetara m maka aja nsure ọkụ, maọbụ jiri aja niile sọpụrụ m. O nweghị mgbe m kwagidere gị ka i wetara m onyinye mkpụrụ ọka, maọbụ mee ka ike gwụ gị site nʼịna gị ụda na-esi isi ụtọ.


Ọ bụ ezie na ha na-ebu ọnụ, agaghị m ege ntị nʼakwa ha; ọ bụrụkwa na ha achụọrọ m aja nsure ọkụ, maọbụ aja mkpụrụ onyinye, agaghị m anabata ha. Kama, aga m eji mma agha na ụnwụ, na ọrịa dị iche iche bibie ha.”


Gịnị ka m ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke unu si nʼobodo Sheba bubata, eme? Gịnị ka m ji ụda kalamus ọma unu si mba dị anya bubata eme? Ajụla m ịnabata aja nsure ọkụ unu niile. Aja niile unu na-achụ adịghị atọ m ụtọ.”


Ya mere, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ebe ọ bụ na unu na-eri anụ nke ọbara dị nʼime ya, na-elekwasịkwa arụsị unu anya, na-awụsikwa ọbara, o kwesiri ka unu nweta ala a?


Ha na-achụ aja dịka onyinye nye m, ha na-erikwa anụ ndị ahụ ha jiri chụọ aja, ma na Onyenwe anyị enweghị mmasị nʼebe aja ha dị. Ugbu a, ọ ga-echeta ajọ omume ha, nye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie niile ha, ha ga-alaghachi nʼIjipt.


Chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke gị, ma anụ na ọbara. A ghaghị ịwụsa ọbara anụ ahụ e ji chụọ aja nʼakụkụ ebe nchụaja nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ma i nwere ike rie anụ ahụ e ji chụọ aja.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan