Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 7:2 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “Guzo nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọ Onyenwe anyị kwusaa ozi a nʼebe ahụ, “ ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị Juda niile, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a niile na-abata ife Onyenwe anyị ofufe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

2 Guzo n'ọnu-uzọ-ama ulo Jehova, we kpọsa okwu a n'ebe ahu, si, Nurunu okwu Jehova, unu Juda nile, ndi nābà n'ọnu-uzọ-ama ndia ikpọ isi ala nye Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 7:2
38 Iomraidhean Croise  

Mikaya gara nʼihu, sị, “Ya mere, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị. Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọkwasịrị nʼocheeze ya, hụkwa usuu nke eluigwe ka ha na-eguzo nʼakụkụ ya, nʼaka nri ya nakwa nʼaka ekpe ya.


Ụkwụ anyị eguzola ugbu a nʼọnụ ụzọ ama gị niile, gị obodo Jerusalem.


Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-achị Sọdọm; geenụ ntị nʼozizi Chineke anyị, unu ndị Gọmọra.


Nụrụnụ ihe Onyenwe anyị na-agwa unu, ụmụ Izrel.


Onyenwe anyị sịrị m, “Kpọsaa okwu ndị a nʼobodo Juda niile, na nʼokporoụzọ Jerusalem niile, ‘Geenụ ntị nʼiwu nke ọgbụgba ndụ ahụ, ma mezuo ihe o kwuru.


Mgbe Jeremaya si na Tofet, ebe ahụ Onyenwe anyị zigara ya ibu amụma lọta, o guzoro nʼogige ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ, gwa ndị mmadụ niile okwu sị ha,


“Gaa, kwupụta na ntị Jerusalem, “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Echetara m ịnụ ọkụ nʼobi nke okorobịa gị nʼoge gara aga ime ihe ga-atọ m ụtọ, ịhụnanya gị dịka onye a lụrụ ọhụrụ, echetakwara m otu unu si soro m nʼime ọzara, ga nʼala tọgbọrọ nʼefu nke a na-akụghị mkpụrụ.


Nụrụ okwu nke Onyenwe anyị unu ụlọ Jekọb, na unu ndị bụ agbụrụ niile sitere nʼIzrel.


Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Guzo nʼogige ụlọnsọ Onyenwe anyị. Nọdụ nʼebe ahụ gwa ndị niile si nʼobodo Juda bịa ịkpọ isiala nʼụlọnsọ Onyenwe anyị okwu. Gwa ha ihe ahụ niile m nyere gị nʼiwu. Mee ka ihe ndị ahụ niile m nyere gị nʼiwu rute ha ntị, na-afọdụghị otu.


Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma zara Hananaya onye amụma nʼihu ndị nchụaja na ndị mmadụ niile guzo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị


“ ‘Ma nụrụkwa nkwa Onyenwe anyị na-ekwe gị, gị Zedekaya eze Juda. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere gị, Ị gaghị anwụ site na mma agha;


Baruk nọ nʼọnụụlọ Gemaraya nwa Shefan, bụ ode akwụkwọ, gụpụtara ndị niile nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị okwu Jeremaya, nke dị nʼakwụkwọ a dị nsọ nʼọnụ ụzọ ama ọhụrụ nke ụlọnsọ ahụ.


Nʼihi ya, gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼụbọchị ibu ọnụ, nọdụ nʼebe ahụ gụpụtara ndị mmadụ okwu Onyenwe anyị ndị a ị dere nʼakwụkwọ dịka m kpọpụtara ha. Gụpụtara ya ndị Juda si obodo niile bịa nʼụlọnsọ ahụ.


Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndị inyom ahụ, na ndị Izrel niile okwu sị ha, “Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Juda niile nọ nʼIjipt.


Ndị a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya.


Aka nke Onyenwe anyị dịkwasịrị m, o sitekwara nʼike Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bulie m, debe m nʼetiti ndagwurugwu nke jupụtara nʼọkpụkpụ.


“Nụrụnụ nke a, unu ndị nchụaja! Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel! Geenụ ntị, unu ndị ezinaụlọ eze. Nʼihi na ọ bụ unu ka ikpe ahụ gbasara. Nʼihi na unu abụrụla ihe ị maa nʼọnya na Mizpa, na ụgbụ agbasara nʼelu Taboa.


Nʼihi ya, ugbu a nụrụ okwu Onyenwe anyị, ma unu na-asị, “ ‘Ebula amụma megide Izrel, ekwukwala okwu megide ụlọ Aịzik.’


Geenụ ntị, unu ndị mmadụ, unu niile, gee ntị, gị ụwa na ndị niile bi nʼime ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gbaa akaebe megide unu, bụ Onyenwe anyị site nʼụlọnsọ ukwu ya.


Mgbe ahụ ekwuru m sị, “Geenụ ntị unu ndịisi ụlọ Jekọb, na unu ndị na-achị ezinaụlọ Izrel. Ọ bụ na unu ekwesighị ịmata ikpe ziri ezi


Geenụ ntị unu ndị na-achị ezinaụlọ Jekọb, na unu ndịisi ezinaụlọ Izrel. Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị, ma na-ewere ihe niile na-ezighị ezi nʼọnọdụ ihe ziri ezi.


Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”


Jisọs zara ya, “Nʼihu ọha mmadụ ka m kwuru okwu niile m kwuru. A kuziri m ihe nʼime ụlọ ekpere na nʼime ụlọnsọ ukwu ebe ndị Juu na-ezukọ. Ekwukwaghị m ihe ọbụla na nzuzo.


“Gaanụ, guzoronụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ gwa ndị mmadụ ozi niile nke ndụ ọhụrụ a.”


Ụbọchị niile, nʼime ụlọnsọ ukwu ma nʼụlọ ndị mmadụ ha na-akụzi ma na-ekwusa oziọma na Jisọs bụ Kraịst ahụ.


Onye ọbụla nwere ntị ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Onye ọbụla na-emeri emeri, ọnwụ nke ugboro abụọ agaghị emekpa ya ahụ.


Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Ọ bụ naanị onye na-emeri emeri ka m ga-enye ụfọdụ nʼime achịcha mánà ahụ e zoro ezo. Aga m enyekwa onye ahụ ezi nkume ọcha ahụ, nke edekwasịrị aha ọhụrụ nʼelu ya, nke onye ọbụla ọzọ na-agaghị amata, karịa onye ahụ natara ya.


Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.


Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ. Onye ahụ na-emeri emeri ka m ga-enye ike iri mkpụrụ sitere nʼosisi ndụ ahụ nke dị na paradaịs nke Chineke.


Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.


Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.”


Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ nsọ na-agwa nzukọ niile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan