Jeremaya 7:18 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a18 Ụmụ na-achịkọta nkụ nke nna ha ji emenye ọkụ, ebe nne ha na-eghe achịcha ha na-eche nʼihu Eze nwanyị mbara Eluigwe. Ha na-awụpụrụ chi ndị ọzọ mmanya nʼihi ịkpasu m iwe. Faic an caibideilBible Nso18 Umu-ha nāchikọta nkú, ndi bu nna nāfunwu ọku, ndinyom-ha nāgwọ utu ọka flour koro eko, imere eze-nwanyi nke elu-igwe achicha, na iwusiri chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu, ka ha we kpasuem iwe. Faic an caibideil |
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu na ndị nwunye unu esitela nʼomume unu gosi na unu na-emezu ihe ndị ahụ unu ji ọnụ kwuo sị, ‘Anyị aghaghị imezu nkwa niile anyị kwere banyere ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nke ihe ọṅụṅụ nye Eze nwanyị mbara Eluigwe.’ “Gaanụ nʼihu mezuo nkwa unu kwere! Mezuokwanụ iyi unu ṅụrụ.
O mere ka m baa nʼime ogige dị nʼime ụlọ ukwu nke Onyenwe anyị, nʼebe ahụ, nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị, nʼagbata ebe ịchụ aja na mpụta ọnụ ụlọ ahụ, ka ihe ruru iri mmadụ abụọ na ise guzo, chee ihu ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na-efe anyanwụ. Ha gbakụtara ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị azụ mgbe ha na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ na-akpọ isiala nye anyanwụ.