Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 7:16 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 “Ya mere, unu ekperela m ekpere nʼihi ndị a; unu atụfula oge unu ịrịọ m arịrịọ nʼihi ha. Agaghị m ege ntị nʼekpere na arịrịọ unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

16 Ma gi onwe-gi, ekpela ekpere bayere ndi nka, ebuli-kwa-la iti-nkpu na ikpe-ekpere bayere ha, ariọ-kwa-lam aririọ: n'ihi na M'gaghi-anānu olu-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 7:16
14 Iomraidhean Croise  

Benaya, nwa Jehoiada, bụ onyeisi ndị Keret na Pelet. Ụmụ ndị ikom Devid bụkwa ndị nchụaja.


Ugbu a, hapụ m ka iwe m bịakwasị ha, ka m laa ha nʼiyi. Aga m eme ka gị onwe gị bụ Mosis bụrụ mba ukwu nʼọnọdụ ha.”


Mgbe unu na-agbasa aka unu nʼekpere, agaghị m aṅa unu ntị; ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, agaghị m aṅa ntị.” Nʼihi na aka unu jupụtara nʼọbara!


“Ekperela ndị a ekpere, arịọkwala arịrịọ ọbụla nʼihi ha. Nʼihi na agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọku m nʼoge ihe mgbu ha.


Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Ọ bụrụ na Mosis na Samuel apụta bịa guzo nʼihu m, ụdịdị obi m agaghị agbanwe nʼebe ndị a nọ. Chụpụ ha nʼihu m. Mee ka ha si nʼebe a pụọ.


Gị onwe gị ajụla m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ị nọgidela na-adaghachi azụ. Ya mere, aga m ebikwasị gị aka, bibie gị. Ike m ji akwụsị gị ka ị ghara ịdaghachi azụ agwụla m.


O kwesiri iji ajọ omume kwụghachi ihe ọma? Ma lee na ha egwuolara m olulu. Chetakwa na m guzooro nʼihu gị ma rịọ gị arịrịọ nʼihi ha. Arịrịọ m bụ ka ị hapụ iweso ha oke iwe.


Ụwa ga-eru ụjụ, mbara eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị. Nʼihi na ekwuola ya, agaghị m agbanwe obi m. Ekpebiela m ya, agaghị m alakwa azụ nʼihe m zubere ime.”


Ọ bụ na unu adịghị ahụ ihe na-eme nʼobodo niile nke Juda, na ihe ha na-eme nʼokporoụzọ niile nke Jerusalem?


Mgbe ahụ ha ga-akpọku Onyenwe anyị, ma ọ gaghị aza ha! Mgbe oge ahụ bịaruru, ọ ga-ezo ihu ha site nʼebe ha nọ nʼihi ihe ọjọọ nke ha mere.


Hapụ m, ka m kpochapụ ma hichapụkwa aha ha site nʼokpuru eluigwe. Aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ike karịa, dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ karịa ha.”


Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ka nwanna ya na-eme mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ, ya kpee ekpere, Chineke ga-enyekwa onye ahụ ndụ. Nke a bụ maka ndị ahụ mmehie ha na-abụghị nke na-eduba nʼọnwụ. E nwere mmehie na-eduba nʼọnwụ. Asịghị m unu kpee ekpere maka nke ahụ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan