Jeremaya 7:13 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a13 Mgbe unu nọ na-eme ihe ndị a niile, ka Onyenwe anyị kwupụtara, agwara m unu okwu mgbe mgbe, ma unu jụrụ ige ntị. Akpọrọ m unu oku, ma unu jụrụ ịza. Faic an caibideilBible Nso13 Ma ub͕u a, n'ihi na unu aluwo ọlu ndia nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'we gwa unu okwu, nēbili n'isi-ututu nēkwu, ma unu anughi; M'we kpọ unu òkù, ma unu azagh: Faic an caibideil |
Gịnị mere o ji bụrụ na o nweghị onye nọ ya mgbe m bịara? Gịnị mere o nweghị onye zara m mgbe m kpọrọ oku? Ọ pụtara na aka m dị mkpụmkpụ ịzọpụta unu? Ọ ga-abụ na m enwekwaghị ike ịzọpụta? Nʼihi na enwere m ike ịbara osimiri mba mee ya ka ọ ghọọ ala akọrọ. Enwere m ike ime ka osimiri ghọrọ ọzara, ka azụ niile dị nʼime ya nwụọ nʼihi enweghị mmiri.
Mgbe mgbe ka m ziteere unu ụmụ ohu m bụ ndị amụma, ndị bịara gwa unu okwu sị, “Dozienụ ụzọ unu, sitekwanụ nʼajọ omume unu tụgharịa. Unu niile nʼotu nʼotu, unu agbasola chi ndị ọzọ ife ha. Ọ bụrụ na unu emee otu a, unu ga-ebi nʼala a m nyere unu na nna nna unu ha.” Ma unu jụrụ ịṅa ntị, jụkwa ige m ntị.