Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 7:10 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Unu ga-emecha bịa guzo nʼihu m nʼụlọnsọ a, nke a kpọkwasịrị aha m, na-asị, “Anyị nọ na nchekwa,” ọ bụ ịnọ na nchekwa maka ime ihe arụ niile ndị a?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

10 we bia guzo n'irum n'ulo a, nke akpọkwasiri aham, si, Anaputawo ayi; ka unu we me ihe-árú ndia nile?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 7:10
31 Iomraidhean Croise  

Onyenwe anyị sịrị ya, “Anụla m ekpere gị, na arịrịọ gị, nke ị rịọrọ nʼihu m. Edoola m ụlọnsọ a nke i wuru nsọ, site nʼitinye Aha m nʼebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Anya m na obi m abụọ ga-adịkwa nʼebe ahụ ụbọchị niile.


O wuru ebe ịchụ aja dị iche iche, nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke Onyenwe anyị, kwuru okwu banyere ya sị, “Ọ bụ na Jerusalem ka m ga-etinye Aha m.”


O wuru ebe ịchụ aja dị iche iche, nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke Onyenwe anyị, kwuru okwu banyere ya, sị, “Aha m ga-adịgide na Jerusalem ruo mgbe ebighị ebi.”


O were oyiyi apịrị apị nke o mere debe nʼime ụlọnsọ Chineke, nke Chineke gwara Devid na nwa ya Solomọn okwu sị, “Nʼụlọnsọ a na nʼime Jerusalem, nke mụ onwe m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel, ka m ga-akpọkwasị Aha m ruo mgbe ebighị ebi.


Onyenwe anyị na-akpọ aja ndị ajọ omume asị, ma ekpere ndị ndụ ha ziri ezi na-atọ ya ụtọ.


Unu ndị na-akpa nganga na unu bụ ndị bi nʼobodo dị nsọ, ndị na-anyakwa isi na unu na-adabere na Chineke Izrel. Onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.


Ha doro oyiyi ihe arụ nʼụlọnsọ ahụ a kpọkwasịrị aha m, si otu a merụọ ya.


Na nwa oge nta gara aga unu chegharịrị mee ihe ziri ezi nʼanya m. Onye ọbụla nʼime unu kpọsara inwere onwe nye ndị unu. Unu gara nʼihu gbaa ndụ nʼihu m nʼime ụlọnsọ ahụ a kpọkwasịrị aha m.


Unu echefuola ihe ọjọọ nna unu ha mere na ihe ọjọọ niile ndị eze Juda na ndị eze nwanyị Juda mere na ihe ọjọọ niile nke unu onwe unu na ndị nwunye unu mekwara nʼala Juda, na nʼokporoụzọ Jerusalem?


Ọ pụtara na ụlọ a, nke a kpọkwasịrị aha m aghọọla ogige nye ndị ohi? Ma anọkwa m ya na-ele unu anya, ka Onyenwe anyị kwupụtara.


Nʼihi ya, ihe ahụ m mere na Shaịlo ka m ga-emekwa ọzọ megide ụlọ ahụ a kpọkwasịrị aha m. E, aga m eme ya megide ụlọnsọ ukwu ahụ unu na-atụkwasị obi unu nʼime ya, ụlọnsọ ukwu ahụ m nyere unu na nna nna unu ha.


“ ‘Onyenwe anyị kwupụtara sị, ndị Juda emeela ihe ọjọọ dị iche iche nʼihu m. Ha akpụọla arụsị rụrụ arụ nke ha tinyere nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ha emerụọla ya.


“ ‘Ma banyere unu, bụ ụlọ Izrel, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Gaanụ fee arụsị unu niile dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu. Ma emesịa, unu aghaghị ịṅa m ntị, ọ dịghịkwa mgbe unu ga-eji onyinye na arụsị unu niile merụọ aha nsọ m.


Ha ga-esite nʼịkpọ asị mesie gị ike, pụnara gị ihe niile i nwere nke ị dọgburu onwe gị nʼọrụ nʼihi ha. Ha ga-ahapụ gị ka ịgbara ọtọ ihu na azụ, mgbe ahụ ihere nke ịgba akwụna gị ga-apụta ihe. Agụụ nke ọchịchọ ọjọọ na ịkwa iko gị


Nʼihi na ha akwaala iko, ọbara jupụtakwara nʼaka ha, ha na arụsị ha kwakwara iko. Ha jikwa ọ bụladị ụmụ nke ha mụtaara m chụọ aja nsure ọkụ nye ha.


Nʼihi na nʼotu ụbọchị ahụ ha ji ụmụ ha chụọ aja nye arụsị ha, bụkwa ụbọchị ha batara nʼụlọnsọ m merụọ ya. Ihe dị otu a ka ha mere nʼụlọnsọ m.


Ya mere, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ebe ọ bụ na unu na-eri anụ nke ọbara dị nʼime ya, na-elekwasịkwa arụsị unu anya, na-awụsikwa ọbara, o kwesiri ka unu nweta ala a?


Ha na-abịakwute gị dịka ndị mmadụ si abịa, ha na-anọrọ ala nʼihu gị na-anụ ihe ị na-ekwu ma ha anaghị emepụta ya nʼomume: nʼihi na ha na-eji egbugbere ọnụ ha na-egosi ịhụnanya, ma obi ha nọ naanị na uru ọjọọ ha ga-enweta.


Ya mere, dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ebe ọ bụ na i jirila oyiyi ihe arụ na omume rụrụ arụ merụọ ụlọ m, aga m esite nʼebe ị nọ wezuga ịhụnanya m. Agaghị m emekwara gị ebere maọbụ hapụ ịta gị ahụhụ.


Chineke m, tọọ ntị gị nʼala nụrụ arịrịọ m. Meghee anya gị abụọ ka ị hụrụ ọnọdụ mbibi nke obodo a na-akpọ aha gị nọ. Anyị anaghị arịọ ka i nyere anyị aka nʼihi na anyị bụ ndị ezi omume, kama anyị na-arịọ nʼihi na ebere gị dị ukwuu.


Dịka ndị na-apụnara mmadụ ihe na-ezo na-eche onye ga-agafe, otu a ka ndị nchụaja si egbu ndị mmadụ nʼụzọ Shekem, leenụ oke ajọ omume ihere dị otu a.


Chụọnụ aja nsure ọkụ dịka aja ekele, site nʼachịcha koro eko; kpọsaakwanụ banyere onyinye afọ ofufu niile unu na-enye, nyaanụ isi banyere ha, unu bụ ndị Izrel, nʼihi na nke a bụ ihe unu hụrụ nʼanya ime.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.


bụ ndị ahụ niile na-anọ nʼelu ụlọ ha na-akpọ isiala nye ọnwa na kpakpando, ha na ndị ahụ niile na-akpọrọ Onyenwe anyị isiala, na-eji aha ya nʼaṅụ iyi, ma na-ejikwa Milkọm na-aṅụ iyi,


Ma site ugbu a gaa nʼihu, ndị nganga ka anyị ga-akpọ ndị ihe na-agara nke ọma. Nʼezie, ndị na-eme ihe ọjọọ ka ihe na-agara nke ọma. Ndị ahụ jikwa ihe ọjọọ ha na-anwa Chineke na-agbanarị ntaramahụhụ ya.’ ”


“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-emechibido ndị ọzọ ụzọ ha ga-esi bata nʼalaeze eluigwe, ma unu onwe unu adịghị abata. Unu adịghịkwa enye ndị ọzọ ohere ịbata.


“Anaghị m ekwu maka unu niile, amaara m ndị m họpụtara. Ma nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, ‘Onye mụ na ya na-erikọ nri ebiliela megide m.’


Mgbe ahụ, ha sitere nʼụlọ Kaịfas duru Jisọs gaa nʼụlọeze Pailet. Ọ bụkwa nʼisi ụtụtụ, ma ha onwe ha abanyeghị nʼime ụlọeze ahụ nʼihi na ha achọghị imerụ onwe ha, ka ha nwee ike isoro rie nri na Mmemme Ngabiga.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan