Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 6:2 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Aga m ebibi ada Zayọn, onye mara ezi mma, na onye dịkwa pekepeke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

2 Nwayi ahu nke mara nma nke di kwa pekepeke, bú ada Zaion, ka M'gēme ka ọ la n'iyì.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 6:2
7 Iomraidhean Croise  

Ada Zayọn ka a hapụrụ dịka ụlọ nche dị nʼubi vaịnị, dịka ụlọ nta dị nʼubi kukumba, dịka obodo ndị iro gbara gburugburu.


Ana m anụ olu iti mkpu akwa nke yiri olu akwa nwanyị ime na-eme, ọ dị ka ude nwanyị na-agbalị ịmụpụta nwa mbụ ya. Ma olu akwa m nụrụ bụ nke ada Zayọn, ebe ọ nọ na-eku ume ike ike. Ọ dara nʼala gbasapụ aka ya, ma na-akwa akwa na-asị, “Onye nwụrụ anwụ ka m bụ! Lee, ndụ m ka e nyere ndị ogbu mmadụ.”


Lee ka Onyenwe anyị si jiri igwe ojii nke iwe ya kpuchie ada Zayọn! O sitela nʼeluigwe tụda ịma mma Izrel nʼala, o chetakwaghị ebe mgbakwasị ụkwụ ya, nʼụbọchị iwe ya.


Gịnị ka m nwere ike ikwu banyere gị? Gịnị ka m ga-eji tụnyere gị, gị ada Jerusalem? Gịnị ka m ga-asị na i yiri, nke ga-enyere m aka ịmata otu m ga-esi kasịe gị obi, gị ada Zayọn na-amaghị nwoke? Ọnya dị gị nʼahụ miri emi, dịka ịdị omimi nke osimiri. Onye pụrụ ịgwọ gị?


Ndị ahụ naara eri ihe ụtọ dị iche iche tọgbọrọ nʼefu ugbu a nʼokporoụzọ. Ndị ahụ a zụrụ iyi uwe uhie uhie nọ ugbu a na-edina nʼebe a na-ekpofu ahịhịa.


Nwanyị nke dịkarịsịrị nwayọọ na-enwekwa mmetụta mmadụ nʼetiti unu, nke dị oke nwayọọ, nke ihe na-emetụta na ọ dịghị amasị ya ịzọgịdesị ọbụ ụkwụ ya ike nʼala, ga-ajụ ikenye di ya ọ hụrụ nʼanya, nwa ya nwoke maọbụ nwa ya nwanyị,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan