Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 51:9 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 “ ‘Anyị gaara agwọ Babilọn, ma ọrịa ji ya enweghị ngwọta. Ka anyị hapụnụ ya; ka anyị niile nʼotu nʼotu laghachi nʼobodo nke aka anyị, nʼihi na ikpe ọmụma dịrị ya eruola mbara eluigwe. Ọ na-arịgokwa ruo nʼigwe ojii.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

9 Ayi gāgwọtawori Babilon, ma agwọtaghi ya: rapunu ya, ka ayi la, onye ọ bula n'ala-ya: n'ihi na ikpé-ya erutuwo elu-igwe, ebuliwo kwa ya rue mbara-ígwé.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 51:9
13 Iomraidhean Croise  

Ma Oded, onye amụma Onyenwe anyị, nọ na Sameria nʼoge a. Ọ pụrụ jekwuru ndị agha ahụ na Sameria sị ha, “Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha mere ka unu merie ndị Juda nʼihi na ha na-efe arụsị. Ma unu ji ọnụma gbuo ha, nke mere na ụzụ tụrụ ruo nʼeluigwe.


nʼekpere sị, “Ihere na-eme m, Chineke m, amaghị otu m ga-esi lelie anya m lekwasị gị nʼihu, nʼihi na mmehie anyị babigara ụba oke, ikpe ọmụma dị na-eche anyị dịkwa ukwuu, nʼezie o ruola eluigwe.


Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nʼime ha ga-eche ihu ya nʼụzọ gawara ebe ndị ya nọ. Ha ga-agbarakwa ọsọ laghachi nʼala nke aka ha dịka mgbada na-agbanarị ndị na-achụ nta, maọbụ ụmụ atụrụ ndị na-enweghị onye na-azụ ha.


Lee ihe ndị a na-enyocha kpakpando ga-emere gị, bụ ndị ị na-aṅa ntị na ndụmọdụ ha site na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ha ga-ahapụ gị gaa nʼụzọ nke aka ha; ị gaghị enwekwa onye ga-azọpụta gị.


Ha ga-asọ ngọngọ mgbe mgbe, ha ga-adakwasịkwa nʼelu ibe ha. Ha ga-asịkwa, ‘Bilienụ ọtọ, bịanụ ka anyị laghachikwuru ndị anyị, ka anyị laghachikwa nʼala ebe a mụrụ anyị, ka anyị wezugakwa onwe anyị site na mma agha nke ndị mmegbu.’


Ndị agha e goro ego nọ nʼetiti ha dịka ụmụ ehi gbara abụba. Ha onwe ha kwa ga-atụgharịa gbaa ọsọ, ha agaghị eguzo, nʼihi na ụbọchị nhụju anya na-abịakwasị ha, bụ ụbọchị a ga-ata ha ahụhụ.


Site na Babilọn wezuga onye na-agha mkpụrụ na onye ji mma owuwe ihe ubi na-ewe ihe ubi. Ka onye ọbụla laghachikwuru ndị nke ya, ka onye ọbụla gbalaakwa nʼala nke aka ya, nʼihi mma agha nke onye na-emegbu emegbu.


“Oge owuwe ihe ubi agafeela, leekwa na ọkọchị agabigakwala, ma a zọpụtabeghị anyị.”


Ahụhụ na-adịrị ha, nʼihi na ha ajụla m. Ha na-ala nʼiyi nʼihi na ha enupula isi ha megide m. Achọrọ m ka m gbapụta ha, ma ha na-agha ụgha megide m.


Mgbe ahụ, anụkwara m olu ọzọ si nʼeluigwe na-akpọ oku na-asị, “ ‘Ndị m, sinụ nʼime ya pụta,’ ka unu ghara iketa oke na mmehie ya, ka unu gharakwa iketa oke ahụhụ ya.


Nʼihi na mmehie ya amụbaala ruo eluigwe. Chineke echetakwala ajọ omume ya niile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan