Jeremaya 51:1 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, aga m akpali mmụọ onye mbibi, ka ọ bịa megide Babilọn na ndị bi na Kaldịa. Faic an caibideilBible Nso1 Otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje ikpọte ifufe nke nēbibi ebibi megide Babilon, na n'ebe ndi bi na Leb-kamai nọ. Faic an caibideil |
“Kpọkọtanụ ndị na-agba ụta maka imegide Babilọn, bụ ndị niile na-agba ụta. Maanụ ụlọ ikwu, gbaa ya gburugburu; unu ekwela ka onye ọbụla si nʼime ya gbapụ. Kwụghachi ya ụgwọ dịka ọrụ ya si dị, dịka ihe niile ahụ o mere si dị meenụ ya otu ahụ. Nʼihi na o buliela onwe ya elu megide Onyenwe anyị, bụ Onye nsọ nke Izrel.